isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 30 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma ub͕u a ha achìwom ọchì, bú ndi bu nwata karim,Ndi m'juru ido ndi bu nna-ha n'etiti nkita nke ìgwè ewu na aturu nkem.

2. Ọzọ, ike aka-ha, gini ka ọ gābaram?Ndi ike nke agadi-ha laworo n'iyì.

3. N'ihi ihe-ukọ na n'ihi agu ha bu ndi nēnweghi ike imu nwa:Ha bu ndi nēwere ezé-ha kọ̀cha ala ọkpọ-nku, nke bu nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu na mb͕e gara aga.

4. Ndi nānyajipu mallow n'akuku umu-osisi;Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha.

5. Anēsi n'etiti madu chupu ha;Ha nētiso ha nkpu dika anētiso onye-ori.

6. N'ebe nākpata ima-jijiji nke ndagwurugwu ka ha nāghaghi ibi,Bú ọnu atùru n'ájá na n'oké nkume.

7. N'etiti umu-osisi ka ha nēti nkpu dika inyinya-ibu;N'okpuru akuba ka ha nējikọta onwe-ha.

8. Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha;Apiapuwo ha n'ala.

9. Ma ub͕u a aghọwom abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara,M'bu-kwa-ra ha okwu ha nēkwughari.

10. Ha nākpọm ihe-árú, ha nọ n'ebe di anya site n'ebe m'nọ,Ha eb͕ochighi kwa onwe-ha n'ibu ọnu-miri n'irum.

11. N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala,Ha achipuwo kwa bridle n'irum.

12. N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili;Ukwum abua ka ha nupuworo,We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.

13. Ha emebiwo uzọm,Ha bara nmebim urù,Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka.

14. Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia:N'okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n'arum.

15. Ihe-egwu echighariwo imegidem,Ha nāchu ọkakam dika ifufe;Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra.

16. Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri;Ubọchi nweda-n'ala nējidem.

17. N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum,Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe.

18. Site n'iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari:Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu.

19. Ọ tubàwom n'apiti,M'we yie ájá na ntu.

20. Anametiku Gi, ma I dighi-azam:Eguzorom ọtọ, I we lekwasim anya.

21. I nāb͕anwe iburum onye nēnweghi obi-ebere:I nēji ume aka-Gi kpab͕uem.

22. I nēbulim nye ifufe, I nēme ka o burum dika inyinya,I ne-atugharim n'elu ebili nmirì.

23. N'ihi na amawom na ọ bu ọnwu ka I gēmem ka m'chigharikuru,Ru kwa ulo nzute nke diri ihe nile di ndu.

24. N'ezie ọ bughi ihe etikpọrọ etikpọ ka Ọ gēseti aka Ya imegide;Ọ buru na ọ di n'ọdida-ya, madu gētiku Chineke n'ihi ihe ndia.

25. Àkwaghm ákwá n'ihi onye ubọchi-ya siri ike?Ò wuteghi nkpuru-obim bayere ob͕eye?

26. Mb͕e m'lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra;M'we chere ìhè, ma ọchichiri biara.

27. Ngiri-afọm nile nāb͕o ab͕ọ, ha anọghi jū;Ubọchi nweda-n'ala nile abiawo n'irum.

28. Ejeghariwom nēji nji, ọ bughi anyanwu mere ya:Ebiliwom ọtọ nime nkpọkọta madu, tikue Chineke.

29. M'ghọworo nkita-ọhia nwa-nne,Ghọ-kwa-ra enyi-nnunu eyì.

30. Akpukpọ-arum di oji, nādapu n'arum,Ọkpukpum erewo kwa ọku site n'ikpọ-nku.