isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 20 Bible Nso (IGBOB)

1. Zofa, bú onye Neama, we za, si,

2. N'ihi nka ka èchìchèm nāzaghachim,Ọbuná n'ihi ime-ngwam nke di nimem.

3. Anuwom ọdidọ-aka-na-nti nke nētiyem n'ọnọdu-ihere,Mọ nke nghọtam nāzakwam.

4. Ì mawo nka site na mb͕e ochie,Site na mb͕e edoro madu n'elu uwa,

5. Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu,Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?

6. Ọ buru na nbuli-ya arigorue elu-igwe,Isi-ya ewe metu igwe-oji;

7. Dika ǹsí-ya ka ọ gāla n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi:Ndi huworo ya gāsi, Òle ebe ọ nọ?

8. Dika nrọ ka ọ gēfelaga, agaghi-achọta kwa ya:Agēme kwa ka o fepu dika ọhù abali.

9. Anya ahuwo ya, ma ọ gaghi-ahu kwa ya ọzọ;Ọnọdu-ya agaghi-ekiri kwa ya ọzọ.

10. Umu-ya gāchọ iru-oma ndi-ob͕eye,Aka-ya abua gēnyeghachi kwa àkù-ya.

11. Ọkpukpu-ya nile juputara n'ume okorọbia-ya,Ma o gēso ya dina n'elu ájá.

12. Ọ buru na ihe ọjọ atọ utọ n'ọnu-ya,Ọ buru na o zobe ya n'okpuru ire-ya;

13. Ọ buru na o nwe ọmiko n'aru ya, we ghara irapu ya,Kama ọ nēb͕ochi ya nokpo-ọnu-ya;

14. Nri-ya nke di na ngiri-afọ-ya ab͕anwewo,Ọ bu òlùlù aju-ala n'ime-ya.

15. O lodawo àkù, we b͕oputa ya:Chineke gēsi n'afọ-ya napu ya àkù ahu.

16. Nsi aju-ala ka ọ gāmiri:Ire agwọ gēb͕u ya.

17. Ọ gaghi-ele miri-iyi anya,Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.

18. Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya;Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.

19. N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha;Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.

20. N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya,Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.

21. Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi;N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.

22. N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya:Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.

23. Ka o rue, n'iriju afọ-ya,Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya,Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.

24. Ọ gēsi n'ihe-ekike-agha ígwè b͕alaga,Uta ọla gāb͕apue ya.

25. Ọ dọputawo ya, o we si n'aru-ya puta:Ọnu-ọnu-ya nke nēb͕upu àmùmà nēsi kwa n'òlùlù-ya puta;Oké ujọ nile di n'aru ya.

26. Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba:Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya;Ọ gērechapu ihe fọduru n'ulo-ikwū-ya.

27. Elu-igwe gēkpughe ajọ omume-ya,Ala nēbili kwa imegide ya.

28. Agēme ka ihe-omume nke ulo-ya je biri n'ala ọzọ,Àkù-ya bu ihe anāwusi awusi n'ubọchi iwe-Ya.