isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 2 Bible Nso (IGBOB)

1. Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha iguzo onwe-ya n'iru Jehova.

2. Jehova we si Setan, Òle ebe i si bia? Setan we za Jehova, si, Site n'igaghari n'uwa, na site n'ijeghari nime ya.

3. Jehova we si Setan, Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: ọ nọ nējide kwa izu-okè-ya, ma i nākpalim imegide ya, iloda ya n'efu.

4. Setan we za Jehova, si, Akpukpọ-aru lara akpukpọ-aru, ọbuná ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n'ọnọdu ndu-ya.

5. Otú ọ di, biko, setipu aka-Gi, metu okpukpu-ya metu kwa anu-aru-ya, ọ ghaghi kwa ib͕akuta Gi azu n'iru Gi.

6. Jehova we si Setan, Le, ọ nọ n'aka-gi; nání debe ndu-ya.

7. Setan we si n'iru Jehova pua, were ihe-ofifi ọjọ tie Job, site n'ọbu-ukwu-ya rue opu-n'isi-ya.

8. O we were n'onwe-ya ejùjù iji kọ onwe-ya ọkọ; ya onwe-ya nānọdu kwa n'etiti ntu.

9. Nwunye-ya we si ya, Ì nọ nējide izu-okè-gi? b͕akuta Chineke azu, nwua.

10. Ọ si ya, Dika otù nime ndinyom nzuzu si ekwu, otú a ka i nēkwu. Àyi gānara kwa ezi ihe n'aka Chineke, ghara inara ihe ọjọ? Nihe a nile Job ejighi eb͕ub͕ere-onu-ya mehie.

11. Ndi-eyì atọ nke Job we nu ihe ọjọ a nile nke biakwasiri ya, ha we bia, nwoke ọ bula site n'ebe-ya; Elifaz, bú onye Timan; na Bildad, bú onye Shua, na Zofa, bú onye Neama: ha we zukọta n'otù ibia igosi ya ebere ha ji n'aru ya na ikasi ya obi.

12. Ha we welie anya-ha site n'ebe di anya, le ya, ma ha amataghi ya, ha we welie olu-ha, kwa ákwá. ha we dọwa, nwoke ọ bula uwe-nwuda-ya, ha we kpokwasi ájá n'isi-ha n'ikpoli ya n'ebe elu-igwe di.