1. Job we za, si,
2. Ọbuná ta nnupu-isi ka ntamum bu:Akam di arọ́ n'ihi ize-umem.
3. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na amaram ebe m'gāchọta Ya!Ma asi na agamabiaru ọnọdu-Ya guzosiri ike!
4. Ka m'do ikpém n'usoro n'iru Ya,Meju kwa onum n'iru-uka.
5. Kam'mara okwu nile Ọ gāzaghachim,Ka m'ghọta kwa ihe Ọ gāsim.
6. Ọ̀ bu n'uba ǹke ike-Ya ka O gēkpesom ikpe?É-è; kama Ya onwe-ya gēchem iru.
7. N'ebe ahu ka onye ziri ezi nēso Ya ru uka;Ewe me ka m'b͕apu n'aka Onye-ikpem rue mb͕e ebighi-ebi.
8. Le, m'ga n'iru, ma Ọ nọghi ya;M'ga kwa n'azu, ma adighm-ahuta Ya:
9. M'ga n'aka-ekpe, mb͕e Ọ nālu ọlu, ma adighm-ahu Ya anya:Ọ nēkpuchi Onwe-ya n'aka-nri, m'we ghara ihu Ya.
10. N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga;Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.
11. Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso;Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem.
12. Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya;Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.
13. Ma Ya onwe-ya nọ n'otù èchìchè, ònye kwa gechighari Ya?Nkpuru-obi-Ya achọsiwo kwa ike, O we me ya.
14. N'ihi na Ọ nēmezu ihe bu òkèm:Ma ọtutu ihe dika ihe ndia di n'aka-Ya.
15. N'ihi ya ka m'nāma jijiji n'iru Ya;Anamaghọta, m'nātu kwa oké egwu Ya.
16. N'ihi na Chineke emewo ka obim lọ miri,Onye puru ime ihe nile emewo kwa ka m'ma jijiji:
17. N'ihi na ekpochapughm n'iru ọchichiri,O kpuchighi kwa oké ọchichiri n'irum.