isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 5 Bible Nso (IGBOB)

1. Biko, kpọ òkù; ọ̀ di onye nāza gi?Ònyè n'etiti ndi nsọ ka i gēche kwa iru?

2. N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya,Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.

3. Mu onwem ahuwo onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ọ nāb͕a ngbọrọgwu:M'we bua ebe-obibi-ya ọnu na mberede.

4. Umu-ya nānọpu anya n'ebe nzọputa di,Ewe zọpia ha n'ọnu-uzọ-ama,Ọ dighi kwa onye nānaputa ha.

5. Onye onye-agu nēripia owuwe-ihe-ubi-ya,Nēsi kwa ọbuná n'ogwu were ya,Ọnyà nēkusi ume ike inwe àkù-ha.

6. N'ihi na ajọ ihe adighi-esi n'ájá puta,Ọ bughi kwa n'ala ka ọnọdu ọjọ si epuputa;

7. Kama anāmuputa madu nye ọnọdu ọjọ,Dika icheke-ọku nile nēfeli elu.

8. Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke,Chineke ka m'gēbo kwa okwum:

9. Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi;Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:

10. Onye nēnye miri-ozuzo n'elu ala,Nēziga kwa miri n'elu ebe di n'èzi:

11. Ido ndi di ala n'ebe di elu;Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n'elu nime nzọputa.

12. Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ,Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere.

13. Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha:Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa.

14. N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri,Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.

15. O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha,Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike.

16. Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya,Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya.

17. Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba:Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.

18. N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u,Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.

19. Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi;Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.

20. N'oké unwu Ọ b͕aputawo gi n'ọnwu;B͕aputa kwa gi n'aka mma-agha n'agha.

21. Mb͕e ire nāpia utari agēzo gi;I gaghi-atu kwa egwu ihe-ike mb͕e ọ nābia.

22. I gāchì ihe-ike, chì kwa agu, ọchì;I gaghi-atu kwa egwu anu-ọhia nke uwa.

23. N'ihi na gi na nkume ọhia nile gādi n'ọb͕ub͕a-ndu;Gi na anu ọhia gādi kwa n'udo.

24. I gāma kwa na ulo-ikwū-gi di n'udo;I gēlekọta kwa ebe-obibi-gi, i gaghi-emehie kwa.

25. I gāma kwa na nkpuru-gi di ọtutu,Umu nke putara n'aru-gi gādi kwa ka ihe-ọkukú nke ala.

26. I gābia n'ílì n'ezib͕o agadi,Dika obo ọka si ala elu na mb͕e-ya.