1. N'ihi na ebe ọla-ọcha si aputa di,Na ebe nke diri ọla-edo ahu ha nānucha anucha.
2. Anēsi n'ájá eweputa ígwè,Anāwu kwa nkume ighọ ọla.
3. Madu emewo ọchichiri ka o nwe ọgwugwu,Rue nsọtu nile ka ya onwe-ya nēgwuputa kwaNkume nke oké ọchichiri na onyinyo ọnwu.
4. O siwo n'ebe madu nọ dika ọbìa tua ọnu;Ha bu ndi ukwu nke nāga aga nēchezọ;Anākwuba ha udọ̀ n'ebe di madu anya, ha nākwufeghari.
5. Ala, nime ya ka nri si aputa:Ma n'okpuru ya ka atughariworo ya dika ọ bu ọku mere ya.
6. Ọnọdu sapphire ka nkume-ya nile bu,Ọ nwe-kwa-ra ájá ọla-edo.
7. Ọ bu uzọ nke udele nāmaghi,Anya agu-nkwọ ahughi kwa ya:
8. Anu-ọhia di nganga azọghi ya ukwu,Ọdum nāb͕ọ uja agabigaghi kwa n'elu ya.
9. Oké nkume ọmu ka o setipuworo aka-ya imegide;Okpùwo ugwu iru site na nkpọrọgwu-ha.
10. N'oké nkume nile ka ọ waputaworo uzọ miri si erù;Anya-ya ahuwo kwa ihe ọ bula di oké ọnu-ahia.
11. O kechiwo osimiri ka ha ghara itu miri;Ihe-nzuzo ka ọ nēme kwa ka ọ puta ìhè.
12. Ma amam-ihe, òle ebe agāchọputa ya?Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?
13. Madu amaghi ọ̀rùrù-ọnu-ya;Agaghi-achọta kwa ya n'ala ndi di ndu.
14. Ob͕u-miri siri, Ọ bughi nimem ka ọ di:Oké osimiri si-kwa-ra, Ọ dighi n'akam.
15. Adighi-enye ọla-edo makarisiri nma n'ọnọdu ya,Adighi-atù kwa ọla-ọcha ibu ọnu-ahia-ya.
16. Adighi-eji ọla-edo ọma nke Ofia,Adighi-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tù ya.
17. Adighi-ewere ọla-edo na enyo turu ya:Ihe ọla-edo anuchara anucha abughi kwa ihe-nb͕anwe-ya.
18. Agaghi-ehota coral na crystal:E, nnweta amam-ihe kariri ruby.
19. Adighi-ewere topaz nke Etiopia turu ya,Adighi-eji ọla-edo ọma anāgwaghi agwa tù ya.
20. Ma amam-ihe, òle ebe o si bia?Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?
21. N'ihi na ezonariwo ya n'anya ihe nile di ndu,Esiwo kwa n'anu-ufe nke elu-igwe zopu ya.
22. Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri,Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya.
23. Chineke aghọtawo uzọ-ya,Ya onwe-ya amawo kwa ọnọdu-ya.
24. N'ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa,N'okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe;
25. Imere ifufe ihe-ọtùtù;Miri ka Ọ tùwo-kwa-ra n'ọtùtù.
26. Mbe Ọ tọrọ ukpuru nye miri-ozuzo,Dozi kwa uzọ nye àmùmà nke éb͕è-elu-igwe:
27. Mb͕e ahu ka Ọ huru ya, we kọ akukọ-ya;O mere ka o guzosie ike, O gwuputara ala-ya.