isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 21 Bible Nso (IGBOB)

1. Job we za, si,

2. Nurunu okwum nke-ọma;Ka nka buru kwa nkasi-obi-nnu.

3. Nagidenum, mu onwem gēkwu kwa okwu;Ma mb͕e m'kwusiri okwu, i gāchì ọchì.

4. Mu onwem, ọ̀ bu madu ka m'nātamuru ntamu?Ma ọ buru na ọ di otú a, gini mere mọm nējighi arapu ibu ihe nādighi-ewe iwe ọsọsọ?

5. Chenum iru, ka ibobo nwu kwa unu n'aru,Tukwasi-kwa-nu aka n'ọnu.

6. Ọ buru kwa na echetam, anam-ama jijiji,Ima-jijiji ejidewo kwa anu-arum.

7. Gini mere ndi nēmebi iwu nādi ndu,Ghọ okenye, nābu kwa ndi di ike bu dìnkpà?

8. Emewo ka nkpuru-ha so ha guzosie ike n'iru ha,Emewo kwa ka umu nke putara n'aru-ha guzosie ike n'anya-ha.

9. Ulo-ha di n'udo pua n'oké egwu,Nkpa-n'aka Chineke adighi kwa n'aru ha.

10. Oke-ehi-ya nāb͕à nne-ehi, ọ dighi-ab͕ahie;Nne-ehi-ya nāmu nwa, ọ dighi-ekwo ime.

11. Ha nēzipu umu-ha nāṅu ara dika ìgwè ewu na aturu,Umu-ha nēte kwa egwú.

12. Ha nēweli olu-ha n'egwú-otiti na ubọ-akwara,Nāṅuri kwa ọǹu n'olu ọ̀jà.

13. Ha nāla ubọchi nile ha n'iyì n'ọdi-nma,Ma n'otù ntabi-anya ha nārida n'ala-mọ.

14. Ha we si Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi;N'ihi na ọmuma uzọ-Gi nile atọghi ayi utọ.

15. Gini bu Onye Nke puru ime ihe nile, nke ayi gābu orù-Ya?Gini ka ọ gābara ayi, ma ayi riọ Ya aririọ?

16. Le, ọ bughi n'aka-ha ka ọdi-nma-ha di:Ndum-ọdu nke ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.

17. Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu?Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha?Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya?

18. Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe,Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?

19. Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya.Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya.

20. Ka anya-ya abua hu nbibi-ya,Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.

21. N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri,Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti?

22. Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe.

23. Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè,Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo:

24. Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi,Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri.

25. Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi,Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe.

26. Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ,Ikpuru nēkpuchi kwa ha.

27. Le, amawom èchìchè-unu,Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike.

28. N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di?Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa?

29. Ùnu ajughi ndi nāgabiga n'uzọ?Ùnu amaghi kwa ihe-iriba-ama-ha?

30. Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ?Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha?

31. Ònye gēgosi uzọ-ya n'iru ya?Ihe ahu kwa nke o mere, ònye gākwughachi ya?

32. Ma agēburu onye ahu rue ílì,Ọ gēche kwa nche n'elu obo-ya.

33. Ọkpurukpu-àjà nke ndagwurugwu gātọ ya utọ,Madu nile gādọrọ onwe-ha iso ya n'azu,Dika ndi anāpughi igu ọnu buru ya uzọ.