isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 13 Bible Nso (IGBOB)

1. Le, ihe a nile ka anyam huworo,Ntim anuwo, ghọta kwa ya.

2. Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m'maworo, ọbuná mu onwem:Mu onwem abughi onye dara ada kari unu.

3. Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu,Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.

4. Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu,Ndi-dibia efu ka unu nile bu.

5. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti!Ọ we ghọro unu amam-ihe.

6. Biko, nurunu iru-ukam,Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.

7. Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume?Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?

8. Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma?Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?

9. Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu?Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?

10. Ọ ghaghi ibara unu nba,Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo.

11. Nbùli-elu-Ya adighi-eme ka unu tua egwu nke-uku?Oké egwu-Ya adighi-adakwasi kwa unu?

12. Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu,Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu.

13. B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem,Gini gāgabiga kwa n'arum?

14. N'ìhi gini ka m'gēburu anu-arum n'ezém,Tiye kwa ndum n'ọbu-akam?

15. Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere:Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya.

16. Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa;N'ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n'iru Ya.

17. Nurunu okwum nile nke-ọma,Ka nkwuputam di kwa na nti-unu.

18. Biko, le, edowom ikpém n'usoro;Amawom na mu onwem bu onye ezi omume.

19. Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe?N'ihi na ub͕u a ka m'gāb͕a nkiti, kubìe ume.

20. Nání emelam ihe abua,Mb͕e ahu m'gaghi-ezopu onwem n'iru Gi:

21. Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya;Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.

22. Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa;Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam.

23. Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole?Me ka m'mara njehiem na nmehiem.

24. N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi,Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?

25. Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji?Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ?

26. N'ihi na I nēde ihe di ilu n'akwukwọ megidem,I nēme kwa ka m'nweta ajọ omume nile m'mere n'okorọbiam:

27. I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya;I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum:

28. Bú madu nke di ka ihe rere ure nke nāka nká,Dika uwe nke nla riworo.