1. Madu nke nwayi muru,Ubọchi-ndu-ya di nkpunkpu, afọ ejuwo kwa ya n'ahuhu.
2. Dika okoko-osisi ka ọ putaworo, ewe nēbipu ya:O we nāb͕alaga dika onyinyo, ọ dighi-eguzo kwa.
3. Ọ̀ bu kwa n'aru onye a ka I megheworo anya-Gi,Me ka m'so Gi ba n'ikpé?
4. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ihe ọcha gāputa n'ihe ruru árú! ọ dighi otù ihe ọcha gāputa na ya.
5. Ebe ihe akara àkà ka ubọchi-ya nile bu, ọnu-ọgugu nke ọnwa-ya nile di n'aka-Gi,I mewo ókè-ya, ọ gaghi-agabiga kwa ya;
6. Lepu ya anya, ka o we kwusi,Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu.
7. N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya,Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.
8. Ọ buru na nkpọrọgwu-ya eme ochie n'ala,Ogwe-ya anwu kwa n'ájá;
9. Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ,Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.
10. Ma onye di ike gānwu, ike gāgwu kwa ya:Madu we kubìe ume, òle ebe ọ nọ kwa?
11. Miri esiwo n'oké osimiri la,Osimiri we tasia, takọrọ;
12. Otú a madu edinawo, ọ dighi-ebili kwa:Rue mb͕e elu-igwe nādighi, ha agaghi-eteta,Agaghi-akpọte kwa ha n'ura-ha.
13. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I zobem n'ala-mọ,Ma asi na I debem na nzuzo, rue mb͕e iwe-Gi laghachiri,Ma asi na I kparam ókè, we chetam!
14. Ọ buru na madu anwua, ọ̀ gadi ndu ọzọ?Ubọchi nile nke obubu-agham ka m'gēche,Rue mb͕e nb͕anwem gābia.
15. I gākpọ òkù, mu onwem gāza kwa Gi:Agu ọlu aka-Gi gāgu Gi.
16. N'ihi na ubu a I nāgu nzọ-ukwum ọnu:Ì dighi-elezi nmehiem anya?
17. Akachiwo njehiem akàrà n'àkpà,I we tekpue ajọ omumem ihe.
18. Ma otú ọ di, ugwu nke nāda ada nāla n'iyì,Anākwapu kwa oké nkume n'ọnọdu ya.
19. Miri nēme ka nkume ta;Orúrú-ya nāṅachapu ájá ala:Olile-anya madu ka I mewo-kwa-ra ka ọ la n'iyì.
20. I nwere ike n'aru ya rue mb͕e ebighi-ebi, ọ we la;I nēme ka iru-ya b͕anwe, I we zilaga ya.
21. Anāsọpuru umu-ya ndikom, ma ọ dighi-ama ya;Ha nāghọ kwa ndi ntà, ma ọ dighi-amata ihe bayere ha.