isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 34 Bible Nso (IGBOB)

1. Elaihu we nāza, si,

2. Ndi-amam-ihe, nurunu okwum nile;Ndi mara ihe kwa, ṅanun nti.

3. N'ihi na nti nānwa okwu nile,Okpo-ọnu nēdetu kwa ihe-oriri.

4. Ka ayi rọputara onwe-ayi ikpé:Ka ayi mara n'etiti onwe-ayi ihe di nma.

5. N'ihi na Job siri, Abum onye ezi omume,Ma Chineke ewezugawo ikpém:

6. M'gēkwu okwu-ugha megide ikpém?Ọnyá-àkum adighi ngwọta, ọ bu ezie na njehie adighi.

7. Òle madu di ka Job?Ọ nāṅu ichì-ọchì dika miri,

8. Nēso kwa ndi nālu ajọ ihe ga ije, buru onye ejikọtara ya na ha,O we so ndi nēmebi iwu jeghari.

9. N'ihi na ọ siri, Ọ dighi ihe ọ bara maduMb͕e ihe Chineke nātọ ya utọ.

10. N'ihi nka, unu ndi nwere obi, genum nti:Ya buru Chineke ihe-árú, bú imebi iwu;Ya buru kwa Onye puru ime ihe nile ihe-árú, bú ime ajọ omume.

11. N'ihi na ọlu madu ka Ọ gākwughachi ya,Na dika uzọ nwoke si di, otú a ka Ọ gēme ka ọ huta.

12. E, n'ezie, Chineke agaghi-emebi iwu,Onye puru ime ihe nile agaghi-eme kwa ka ikpé buru ajọ omume.

13. Ònye mere Ya onye-nlekọta uwa?Ma-ọbu ònye doro elu-uwa dum madu bi?

14. Ọ buru na Ọ tukwasi ya obi-Ya,Ọ buru na Ọ chikọta mọ-ya na iku-ume-ya n'ebe Ọ nọ;

15. Anu-aru nile gēkubìkọ ume,Mdu gālaghachi kwa n'ájá.

16. Ma ọ buru na i nwere nghọta, nuru nka:Ṅa nti olu okwum nile.

17. Ọzọ, onye nākpọ ezi ikpé asì, ọ̀ gāchi achi?Ma-ọbu ì gāma Onye ezi omume di ike ikpe?

18. Àgāsi eze, Gi onye jọb͕uru onwe-gi?Àgāsi ndi amara aha-ha, Unu ndi-nmebi-iwu?

19. Àgāsi kwa Ya otú a, bú Onye nādighi-ahu ndi-isi iru-ọma,Nke nādighi-amata kwa ọgaranya kari onye nēnweghi ike?N'ihi na ọlu nke aka-Ya ka ha nile bu.

20. N'otù ntabi-anya ka ha gānwu, ọbuná n'etiti abali;Anēme ka ndi ahu me nkpatu, ha nāgabiga kwa,Anēwezuga kwa onye di ike, nēweghi aka ọ bula.

21. N'ihi na anya-Ya dikwasi uzọ nile nke madu,Nzọ-ukwu-ya nile ka Ọ nāhu kwa.

22. Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di,Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha.

23. N'ihi na Ọ dighi-atukwasi madu ihe ọzọ,Ọ bu nání ijekuru Chineke n'ikpé.

24. O nētijisi ndi di ike, ma ngwuputa-ala-ya adighi,Ọ we neguzo ndi ọzọ n'ọnọdu ha.

25. N'ihi ya Ọ nāmata ọlu nile ha;O we nēkpù ha iru n'abali, ewe zọpia ha.

26. Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha akaN'ọnọdu ndi nāhu ha anya;

27. N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha,Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:

28. Ime ka iti-nkpu nke onye nēnweghi ike biarue Ya ruo,Iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala ka Ọ nānu kwa.

29. Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe?Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya?Ma ọ bu n'ebe mba nọ, ma-ọbu n'ebe madu nọ, n'otù aka ahu:

30. Ka madu emeruru emeru we ghara ibu eze,Ka ndi nēsiri ndi ahu ọnya we ghara idi.

31. N'ihi na ọ̀ di onye ọ bula siworo Chineke,Eburuwom ahuhu, m'gaghi-eme ajọ omume ọzọ:

32. Ihe m'nāhughi, Gi onwe-gi zím ya:Ọ buru na emewom ajọ omume, m'gaghi-eme kwa ya ọzọ?

33. Ọ̀ bu site n'ebe i nọ ka Ọ gākwughachi, nke i nāju ya?N'ihi na gi onwe-gi gārọputa, ọ bughi mu onwem: Ma ihe i maworo, kwue ya.

34. Madu ndi nwere obi gāsim,Ha na nwoke ọ bula mara ihe nke nēgem nti:

35. Job, ọ bughi n'ọmuma-ihe ka o nēkwu,Okwu-ya nile adighi kwa n'inwe-uche.

36. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na anwa Job rue mb͕e ebighi-ebi,N'ihi na ọ nāzaghachi dika ajọ madu.