isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 41 Bible Nso (IGBOB)

1. Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi?Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya?

2. Ì gētiye udọ̀-ami n'imi-ya?Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya?

3. Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara?Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò?

4. Ò gēso gi b͕a ndu?Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi?

5. Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu?Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi?

6. Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia?Hà gēkè ya n'etiti ndi-ahia?

7. Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya?Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya?

8. Tukwasi ya ọbu-aka-gi;Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ.

9. Le, nchere-ya bu ihe-ugha:Àdighi-atuda madu ọbuná n'ile ya anya?

10. Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya:Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n'irum?

11. Ònye buru uzọ nyem, nke M'gākwughachi?Ihe ọ bula nke di n'okpuru elu-igwe nile, nkem ka ọ bu.

12. M'gaghi-ab͕a nkiti bayere ihe nile di ya n'aru,Ma-ọbu okwu nke idi-ike-ya, ma-ọbu ima-nma nke odudo-n'usoro-ya.

13. Ònye kpugheworo iru uwe-ya?Ònye gābà n'ab͕a-ya apiajiri okpùkpù abua?

14. Ònye gēmeghe uzọ nke iru-ya?Ezé-ya di oké ujọ buruburu.

15. Usoro nke ọta azu-ya bu npako-ya,Ha bu ihe emechiri emechi dika agāsi na eji ihe-akàrà siri ike mechi ya.

16. Dika otù si nọ ibe-ya nso,Ifufe adighi-abà n'etiti ha.

17. Anēme ka otù rapara n'aru nwa-nne-ya;Ha nējisi onwe-ha ike, agaghi-ekesa kwa ha.

18. Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu,Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.

19. N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa,Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha.

20. N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa,Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.

21. Iku-ume-ya nāmunye icheku,Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta.

22. N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya,Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.

23. Ibewa urù anu-aru-ya rapara n'aru onwe-ha:O siri ike n'aru ya; agaghi-emeghari ya.

24. Obi-ya siri ike dika nkume;O si-kwa-ra ike dika nne-nkume-igwe-nri.

25. Mb͕e o nēbuli onwe-ya ndi di ike nātu ujọ:Site n'imebi-obi ha nēsihie uzọ.

26. Ọ buru na madu ewere mma-agha biakwasi ya, mma-agha ahu adighi-eguzosi ike;Ya na ube, na àkú, na uwe-agha.

27. Ọ nāgu ígwè n'okporo-ọka,Nāgu kwa ọla n'osisi rere ure.

28. Àkú adighi-eme ka ọ b͕alaga:Nkume èbè ab͕anweworo ya ahihia-ọka.

29. Anāgu ndele n'ahihia-ọka:Ọ nāchì kwa nkpọtu arua ọchì.

30. Okpuru-ya di ka ejùjù di nkọ:Ọ nāb͕asa dika ọ bu ihe isucha ọka n'elu apiti.

31. Ọ nēme miri di omimi ka ọ b͕ọ dika ite:Ọ nēme oké osimiri ka ọ di ka manu-otite nēsì ísì utọ.

32. Ọ nēme uzọ ka ọ nēnwuso ya;Madu gēchè na ob͕u-miri nwere isi-awọ.

33. Ọ dighi nke di ka ya n'elu ájá uwa,Nke emeworo nēnweghi ujọ.