isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 26 Bible Nso (IGBOB)

1. Job we za, si,

2. Ì siwo aṅa yere ya aka, bú onye nēnweghi ike?Í siwo aṅa zọputa ogwe-aka nke ume nādighi?

3. Ì siwo aṅa dua ya ọdu, bú onye nāmaghi ihe?Ì siwo kwa aṅa me ka amara nzube-ihe n'uba?

4. Ònye ka i gosiworo okwu?Ọ̀ bu kwa onye ume-ya siri nime gi puta?

5. Ndi nādighi ndu nāma jijijiN'okpuru miri na ihe nile nēbi nime ya.

6. Ala-mọ b͕a ọtọ n'iru Ya,Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ebe-ila-n'iyì nwere.

7. Ọ nēseti Ugwu n'elu ebe tọb͕ọrọ n'efu,O nēkokwasi kwa uwa n'ihe nābughi ihe.

8. Ọ nēkechi miri n'oké igwe-oji-Ya;Ma ab͕awaghi igwe-oji n'okpuru ya.

9. Ọ nējisi iru oche-eze-Ya ike,Nāb͕asa igwe-oji-Ya n'elu ya.

10. Ọ kpawo ókè buruburu n'elu miri,Rue nsọtu ìhè na ọchichiri.

11. Ogidi nile nke elu-igwe nāma jijiji,Ibobo nānwu ha site n'ibasi-nba-ike-Ya.

12. Ike-Ya ka O ji me oké osimiri ka o dere du,Nghọta-Ya kwa ka O ji tib͕u Rehab.

13. Esitere n'aka Mọ-Ya chọ elu-igwe nma;Aka-Ya adupúwo agwó nāb͕a ọsọ.