isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 7 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ̀ dighi obubu-agha diri madu n'elu uwa?Ùbọchi-ya adighi ka ubọchi onye egoro ọlu?

2. Dika orù si ekusie ume ike ibà n'okpuru ǹdò,Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya:

3. Otú a ka emeworom ha m'keta ọtutu ọnwa nke ihe-efu,Ọtutu abali nke m'nādọb͕u onwem n'ọlu ka ha gutawo-kwa-ra nyem.

4. Ọ buru na edinam, m'si,Òle mb͕e m'gēbili? ma anyasi esetiwo onwe-ya;Afọ ejuwokwam na ntugharim rue chi-ọbubọ.

5. Anu-arum nēyi ikpuru na ob͕e ájá;Akpukpọ-arum atawo ata, we b͕aze.

6. Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà,Ha we gwusia nenweghi olile-anya.

7. Cheta na ndum bu ifufe:Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.

8. Anya onye nāhum agaghi-ekirim:Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.

9. Dika igwe-oji si agwusi, we la,Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.

10. Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ,Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.

11. Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum;Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm;Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.

12. Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri,Na I nēdo ndi-nche ichem?

13. Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi,Ihe-ndinam gēbupu ntamum;

14. I we were nrọ me ka m'tua ujọ,I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku:

15. Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u,Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.

16. Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi:Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.

17. Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku,Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,

18. Na I nēleta kwa ya ututu nile,Na I nānwaputa ya na mb͕e dikarisiri ntà nile?

19. Rùe ole mb͕e ka I nāgaghi-elepum anya,Ka I nāgaghi-arapum rue mb͕e m'lodara ọnu-mirim?

20. Asi na emehiewom, gini ka m'nēme Gi, Gi Onye nēche madu?N'ìhi gini ka I doworom ibu ihe-ndakwasi n'ebe I nọ,M'we ghọrọ onwem ibu?