1. Elaihu we nāza, si,
2. Ọ̀ bu nka ka i nēchè na ọ bu ikpé-gi?Ma-ọbu Ì siwo, Ezi omumem kariri nke Chineke?
3. Na i nāsi, Gini ka ọ bara Gi?Ùrù gini ka ọ baram kari nmehiem?
4. Mu onwem gāzaghachi gi,Gi na ndi-eyì-gi.
5. Legide elu-igwe anya, hu;Kiri kwa mbara-ígwé nile nke di elu kari gi.
6. Ọ buru na i mehiewo, gini ka i nēmegide Ya?Ọ buru kwa na njehie-gi abawo uba, gini ka i neme Ya?
7. Ọ buru na i bu onye ezi omume, gini ka i nēnye Ya?Ma-ọbu gini ka Ọ nānara n'aka-gi?
8. Nmebi-iwu-gi gēmetu nwoke dika gi;Ezi omume-gi gēmetu kwa nwa nke madu.
9. N'ihi iba-uba nke nmeb͕u ka ha nēti nkpu;Ha nētiku onye gēyere ha aka n'ihi ogwe-aka ndi di ike.
10. Ma ọ dighi onye siri, Òle ebe Chineke nọ, bú Onye merem,Onye nēnye abù ọma n'abali;
11. Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa,Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe?
12. N'ebe ahu ka ha nēti nkpu, ma Ọ dighi-aza,N'ihi npako di ọjọ.
13. N'ezie Chineke agaghi-anu ihe-efu,Onye puru ime ihe nile agaghi-ekiri kwa ya.
14. Otú ọ di, mb͕e i nāsi na i dighi-ekiri Ya,Okwu-ikpe-gi di n'iru Ya, i gēchere kwa Ya.
15. Ma ub͕u a, n'ihi na iwe-Ya eletaghi,Na n'ihi na Ọ ribaghi njehie ama nke-uku;