isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31
  32. 32
  33. 33
  34. 34
  35. 35
  36. 36
  37. 37
  38. 38
  39. 39
  40. 40
  41. 41
  42. 42

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 15 Bible Nso (IGBOB)

1. Elifaz, bú onye Timan, we za, si,

2. Onye mara ihe, ọ̀ gēwere ọmuma-ihe nke bu nání ifufe za?Ọ̀ gēmeju kwa afọ-ya n'ifufe Iru-anyanwu?

3. Ọ̀ gēwere okwu nābaghi n'ihe ru uka,Ma-ọbu okwu nke ọ nējighi ha bara madu urù?

4. E, gi onwe-gi nēmebi egwu,Nēbilata kwa ntughari-uche n'iru Chineke.

5. N'ihi na ajọ omume-gi nēzi ọnu-gi ihe,I nārọputa kwa ire ndi-aghughọ.

6. Ọnu-gi nāma gi ikpe, ọ bughi mu onwem;Eb͕ub͕ere-ọnu-gi nāza kwa imegide gi.

7. Ì bu madu mbu amuru?Ma-ọbu àmuputara gi tutu ugwu adi?

8. Ọ̀ bu ìzù nzuzo Chineke ka i nēge nti?Ì nēbilata-kwa-ra onwe-gi amam-ihe?

9. Gini ka i mara nke ayi nāmaghi?Ì nāghọta ihe nke nādighi nime ayi?

10. Ma onye-isi-awọ ma onye kara nká nọ n'etiti ayi,Ndi ubọchi ndu-ha ka nke nna-gi nke-uku.

11. Ǹkasi-obi Chineke adikara gi ntà,Ha na okwu nke nēmeso gi nwayọ?

12. Gini mere obi-gi ji ebupu gi?Gini me-kwa-ra anya-gi abua ji atabi?

13. Na i nēchighari mọ-gi imegide Chineke,We me ka okwu nile di otú a si n'ọnu-gi puta.

14. Gini ka madu bu, na ọ gādi ọcha n'obi,Na ọ gābu kwa onye ezi omume, bú onye nwayi muru?

15. Le, ọbuná ndi nsọ Ya ka Ọ nādighi-atukwasi obi;Ọzọ, elu-igwe adighi ọcha n'anya-Ya.

16. Ònye-árú nke b͕aruru ab͕aru dika miri gēsi kwa aṅa di ọcha n'anya-Ya,Bú madu nke nāṅu ajọ omume dika miri?

17. M'gēkwuputara gi, gem nti;Ma nka ka m'huworo, m'gākọ kwa ya:

18. (Nke ndi mara ihe nēgosiSite na ndi bu nna-ha, ha ezoghi kwa ya;

19. Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala,Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)

20. Ubọchi nile nke onye nēmebi iwu ka onye ahu nāb͕ali,Bú ọnu-ọgugu arọ nke ezobeworo nye onye nēme ka madu ma jijiji.

21. Olu oké egwu di na nti-ya abua;Mb͕e ọ nọ n'udo ka onye nāpunara madu ihe gābiakute ya:

22. Ọ dighi-ekwe na ọ gēsi n'ochichiri lata,Onye anēche nche inye mma-agha ka ọ bu:

23. Onye nāwaghari ichọ nri ka ọ bu, ọ nāsi, Òle ebe ọ di?Ọ mawo na edoziwo ubochi ọchichiri n'aka-ya:

24. Ahuhu na nkpà nēme ka ọ tua egwu nke-uku;Ha nwere ike n'aru ya, dika eze nke nọ na njikere ibu agha:

25. N'ihi na o setipuwo aka-ya imegide Chineke,Ọ bu kwa imegide Onye Nke puru ime ihe nile ka ọ nēme onwe-ya onye di ike;

26. Ọ nēwere olu kwesiri ike b͕akwasi Ya,Were kwa ihe-nb͕ochi di ib͕idi nke ọta-ya:

27. Nihi na o werewo abuba-ya kpuchie iru-ya,Me ka abuba nke di arọ́ di n'úkwù-ya;

28. O we biri n'obodo ezopuru n'uwa,Nime ulo nke madu nādighi-ebi nime ha,Nke ejikereworo ighọ obo-ihe.

29. Ọ gāghi-abu ọgaranya, àkù-ya adighi-eguzosi kwa ike,Ọ dighi-eseti kwa ihe ha nwere n'uwa.

30. Ọ gaghi-esi n'ọchichiri wezuga onwe-ya;Ire-ọku gēme ka ome-ya kpọ nku,Ọ gēwezuga kwa onwe-ya site n'iku-ume nke ọnu-Ya.

31. Ka ọ ghara ikwere n'ihe-efu, eduhiewo ya:N'ihi na ihe-efu gābu ihe-nb͕anwe-ya.

32. Tutu ubọchi-ya erue ka agēmezu ya,Alaka-ya agaghi-adi ka ahihia ndu.

33. Ọ gēnwosisi nkpuru-vine-ya nke nāchaghi acha, dika osisi vine,Ọ gātuda kwa okoko-osisi-ya, dika osisi olive.

34. N'ihi na nzukọ nke onye emeruru emeru gābu ndi nāpughi imu nwa,Ọku gēripia ulo-ikwū nile nke ndi-ngo.