isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 1 Bible Nso (IGBOB)

1. Ilu di iche iche nke Solomon nwa Devid, bú eze Israel:

2. Ima amam-ihe na idọ-aka-na-nti;Ighọta okwu-ọnu nile nke nghọta;

3. Inara idọ-aka-na-nti nke inwe-uche,Na ezi omume na ikpé na izi-ezi;

4. Inye ndi nēnweghi uche ezi uche,Inye nwa-okorọbia ihe-ọmuma na ìzùzù:

5. Ka onye mara ihe we nu, we tukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya;Ka onye-nghọta we nweta kwa ezi ndum-ọdu:

6. Ighọta ilu, na okwu miri emi;Okwu nile nke ndi mara ihe, na okwu-omimi nile ha.

7. Egwu Jehova bu nmalite ihe-ọmuma:Amam-ihe na idọ-aka-na-nti ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche ledaworo anya.

8. Nwam, nuru idọ-aka-na-nti nke nna-gi,Arapu-kwa-la iwu nne-gi:

9. N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi,Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi.

10. Nwam, ọ buru na ndi-nmehie arà gi urà,Ekwela.

11. Ọ buru na ha asi, Soro ayi je,Ka ayi che anwu ọbara,Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu;

12. Ka ayi lo ha na ndu dika ala-mọ,Bú ndi zuru okè, dika ndi nārida n'olùlù;

13. Ihe nile di oké ọnu-ahia ka ayi gāchọta,Ayi gākwaju ulo-ayi nile n'ihe ayi kwatara n'agha;

14. Nzà-gi ka i gēfe n'etiti ayi;Otù akpa-ego ka ayi nile gēnwekọ:

15. Nwam, esola ha je n'uzọ;B͕ochie ukwu-gi n'iga n'okporo-uzọ-ha:

16. N'ihi na ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ,Ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara.

17. N'ihi na ọ bu n'efu ka anāb͕asa ub͕u,N'anya nnunu ọ bula:

18. Ndia Kwa, ọbara onwe-ha ka ha nēche anwu,Ha nēzobe onwe-ha inwude ndu nke aka ha.

19. Otú a ka uzọ nile nke onye ọ bula nke akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku si di;Ndu nke ndi-nwe-ya ka ọ nēwepu.

20. Amam-ihe nēti nkpu n'èzí;N'amá nile ka ọ nēme ka olu-ya da udà;

21. N'isi ebe nile anātu ùzù ka ọ nākpọ òkù;N'oghere ọnu-uzọ-ama nile,N'obodo, ka o nēkwu okwu-ọnu-ya nile:

22. Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n'anya?Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike?Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì?

23. Laghachinu n'iba-nbam:Le, m'gāwupuru unu mọm,M'gēme ka unu mara okwum nile.

24. N'ihi na akpọwom òkù, unu we ju;Esetipuwom akam, ma ọ dighi onye nāṅa nti;

25. Unu we wezuga ndum-ọdum nile,Unu achọghi kwa iba-nbam:

26. Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m'gāchì ọchì;M'gākwa emò mb͕e oké egwu-unu nābia;

27. Mb͕e oké egwu-unu nābia dika ikuku siri ike,Mb͕e nhuju-anya-unu nābiaru kwa dika oké ifufe;Mb͕e ahuhu na nkpà nābiakwasi unu.

28. Mb͕e ahu ka ha gākpọkum, ma m'gaghi-aza;Ha gāchọsim ike, ma ha agaghi-achọtam:

29. N'ihi na ha kpọrọ ihe-ọmuma asì,Na n'ihi na ọ bughi egwu Jehova ka ha rọputara:

30. Ha achọghi ndum-ọdum;Ha lelìri iba-nbam nile:

31. Ha gēri kwa ufọdu nime nkpuru nke uzọ-ha,Ọ bu kwa ndum-ọdu nile nke aka ha gēju ha afọ.

32. N'ihi na nchighari-azu nke ndi nēnweghi uche gēb͕u ha,Ọ bu kwa inọ-n'udo nke ndi-nzuzu gēme ka ha la n'iyì.