isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 26 Bible Nso (IGBOB)

1. Dika snow na mb͕e okpom-ọku, na dika miri-ozuzo na mb͕e owuwe-ihe-ubi,Otú a nsọpuru amaghi nma nye onye-nzuzu.

2. Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya,Otú a nkọcha adighi-abia n'efu.

3. Utari diri inyinya, bridle diri inyinya-ibu,Nkpa-n'aka di-kwa-ra azu ndi-nzuzu.

4. Azala onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,Ka i we ghara idi ka ya, ọbuná gi onwe-gi.

5. Za onye-nzuzu dika uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ si di,Ka o we ghara ibu onye mara ihe n'anya-ya.

6. Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miriKa onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu.

7. Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe:Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu.

8. Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume,Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.

9. Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè,Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.

10. Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile,Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.

11. Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ,Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.

12. Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya?Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.

13. Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ;Ọdum di n'amá.

14. Dika ibo-ọnu-uzọ si emeghari n'ihe-nkoye-ya,Otú a ka onye-ume-ngwu nēmeghari n'ihe-ndina-ya.

15. Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa;Ọ nāgwu ya ike iweghachi ya n'ọnu-ya.

16. Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-yaKari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.

17. Onye nējide nkita na nti ka ọ bu,Bú onye nāgabiga, nēwebiga iwe ókè n'ihi ise-okwu nābughi nke ya.

18. Dika onye-ará nke nātu àkú nēre ọku,Na àkú, na ọnwu;

19. Otú a ka onye ahu di nke ghọb͕uworo madu-ibe-ya,We si, Ọ̀ bughi egwú ka m'nēgwu?

20. Mb͕e nkú nādighi ọku gānyu:Otú a mb͕e ọ dighi onye nēkwu okwu-azu, ise-okwu gādaju.

21. Dika icheku si di n'ebe icheku nēre ọku di, na dika nkú si di n'ebe ọku di;Otú a ka onye nēse okwu di ime ka ilu-ọ̀gù nwuru ọku.

22. Okwu nile nke onye nēkwu okwu-azu di ka iberibe-nri di iche iche nātọ utọ nke-uku,Okwu ahu aridawo kwa n'ime-ime-ala afọ.

23. Ejùjù nke amachitaworo n'afuru-uzu ọla-ọchaKa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēre ọku na obi ọjọ bu.

24. Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka onye nke nākpọ asì nēji buru onye-iru-abua,Ma nime onwe-ya ka ọ nētiye aghughọ:

25. Mb͕e olu-ya nēkwu amara, ekwela ya;N'ihi na ihe-árú asa di n'obi-ya.

26. Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya,Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya.

27. Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà:Ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru.

28. Ire okwu-ugha nākpọ ndi o gwepiaworo asì;Ọzọ, ọnu nke nēkwu ire-utọ nākpata nnuda.