isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 30 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Agua nwa Jake; ibu eboro ya.Ihe nke si n'ọnu nwoke ahu putara Itiel, ọbuná Itiel na Ukal.

2. N'ezie anu-ọhia ka m'bu kari onye ọ bula,Ọ dighi kwa nghọta madu m'nwere

3. Amutaghkwam amam-ihe,Ọ dighi kwa ihe-ọmuma Onye Nsọ m'mara.

4. Ònye rigoworo n'elu-igwe, we rida?Ònye chikọtaworo ifufe nime nkwukwuba-aka-Ya abua?Ònye kegideworo miri n'uwe-Ya?Ònye meworo ka nsọtu nile nke uwa guzosie ike?Gini bu aha-Ya, gini bu kwa aha nwa-Ya, ma asi na i mara?

5. Okwu-ọnu ọ bula nke Chineke bu ihe anuchaworo:Ọta ka Ọ buru ndi nāb͕abà nime Ya.

6. Atukwasila ihe n'okwu-Ya nile,Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha.

7. Ihe abua ka m'riọworo Gi;Ajulam ha tutu mu anwua:

8. Me ka ihe-efu na okwu-ugha di anya n'ebe m'nọ:Enyelam ọnọdu-ob͕eye ma-ọbu àkù;Me ka m'rie nri rurum:

9. Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova?Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori,We were aha Chinekem me ihe ọjọ.

10. Ekpèla orù ikpè n'iru onye-nwe-ya,Ka o we ghara ikọcha gi, ikpé ewe ma gi.

11. Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha,Ha adighi-agọzi kwa nne-ha.

12. Ọb͕ọ di nke di ọcha n'anya-ha,Ma orurú-inyi-ha nke nēsì ísì ka anāsachapughi.

13. Ọb͕ọ di, le ka anya-ha si di elu nke-uku!Anēbuli kwa mbubere-anya-ha.

14. Ọb͕ọ di, mma-agha ka ezé nile ha bu, ọ bu kwa mma ka ikiri-ezé-ha bu,Irichapu ndi ewedara n'ala n'uwa, na irichapu ndi-ob͕eye n'etiti madu.

15. Etu nwere umu abua, nāsi, Nye, nye.Ihe atọ di nke afọ nādighi-eju,E, anọ di nke nāsighi, O b͕owo:

16. Ala-mọ; na afọ nwayi-àgà;Na ala afọ miri nējughi;Na ọku nke nāsighi, O b͕owo.

17. Anya nke nākwa nna-ya emò,Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti,Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya,Umu-ugo gēri kwa ya.

18. Ihe atọ di nke karirim ighọta,E, anọ nke m'nāmagh:

19. Uzọ ugo n'elu-igwe;Uzọ agwọ n'elu oké nkume;Uzọ ub͕ọ n'etiti oké osimiri;Na uzọ nwoke n'ebe nwa-ab͕ọghọ nọ.

20. Otú a ka uzọ nwayi nākwa iko di;O riwo ihe, hicha kwa ọnu-ya,Si, Emeghm ajọ ihe ọ bula.

21. N'okpuru ihe atọ ka uwa maworo jijiji,N'okpuru ihe anọ kwa, nke ọ nāpughi iburu:

22. N'okpuru orù mb͕e ọ nāghọ eze;Na onye-nzuzu mb͕e nri nēju ya afọ;

23. N'okpuru nwayi anākpọ asì mb͕e ọ nwere di;Na nwanyi nēje ozi mb͕e ọ nēketa ihe nwanyi-nwe-ya.

24. Ihe anọ di nke di ntà n'elu-uwa,Ma ihe ahu mara ihe nke-uku:

25. Danda bu ndi nādighi ike,Ma ha nēdozi nri-ha na mb͕e okpom-ọku;

26. Coney bu ndi nēnweghi ume,Ma ha nēdo ulo-ha na nkume di elu;

27. Ọ dighi eze igurube nwere,Ma mb͕e ha nāpu ha nēkè onwe-ha n'usu, ha nile;

28. Nche-ulo nēji aka-ya nile agigado,Ma ihe ahu di n'ulo uku eze.

29. Ihe atọ di nke nāzọ ukwu nke-ọma,E, anọ di nke nēje ije nke-ọma:

30. Ọdum, nke bu dike n'etiti anu nile,Ọ dighi-esi kwa n'iru ihe ọ bula laghachi azu;

31. Inyinya-agha; na nkpi;Na eze, nke nbili megide ya nādighi.

32. Ọ buru na i zuzuwo nzuzu n'ibuli onwe-gi,Ma-ọbu ọ buru na i zubewo nzube ọjọ,Tukwasi aka-gi n'ọnu-gi.

33. N'ihi na opìpì miri-ara-ehi nēweputa miri-ara raru araru,Ọzọ, opìpì imi nēweputa ọbara:Otú a ọpìpì iwe nēweputa ise-okwu.