isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 7 Bible Nso (IGBOB)

1. Nwam, debe okwu-ọnum nile,Zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ.

2. Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu,Debe kwa iwum dika nwa-anya nke anya-gi.

3. Ke ha na nkpisi-aka-gi nile;De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi.

4. Si amam-ihe, Nwa-nnem nwanyi ka i bu;Kpọ kwa nghọta nwanyi i mara nke-ọma:

5. Ka ha we debe gi ka i pua n'aka nwanyi nābughi nwunye-gi,N'aka nwanyi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ.

6. N'ihi na na window nke ulomN'oghere-inara-ifufem ka m'lepuru anya;

7. M'we hu n'etiti ndi nēnweghi uche,M'mata n'etiti umu-ndikom,Otù nwa-okorọbia nke obi amam-ihe kọrọ,

8. Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu,Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije;

9. Na chi-ojiji, n'anyasi nke ubọchi,Nime nb͕achi nke abali na ọchichiri.

10. Ma, le, otù nwanyi zutere yaYiri uwe nke nwanyi nākwa iko, ọ bu kwa onye echeworo obi-ya.

11. Onye nēme nkpọtu ka ọ bu, buru kwa onye nēwezuga onwe-ya;Ọ bughi n'ulo-ya ka ukwu-ya nānọ:

12. Ub͕u a n'èzí ka ọ nọ, ub͕u a ọ bu n'amá nile,Ọ bu kwa na nso nkuku nile ọ bula ka ọ nēche anwu.

13. Nwanyi ahu we jide ya aka, sutu kwa ya ọnu,Were iru ihere nādighi si ya:

14. Ihe àjà nile nke àjà-udo di n'akam;Ta ka m'kwughachiworo ihe nile m'kwere na nkwa.

15. N'ihi nka ka m'putara izute gi,Ichọsi iru-gi ike, m'we chọputa gi.

16. Ákwà-nb͕abá mara nma ka m'b͕abáworo n'ihe m'ji edina,Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt.

17. Ewerewom myrrh na aloes na cinnamonFesa ihe-ndinam.

18. Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n'ikwa-iko rue ututu;Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n'ihu-n'anya nile.

19. N'ihi na dim anọghi n'ulo,O jewo ije di anya:

20. Ọ werewo akpa ego n'aka-ya;N'ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata.

21. O were ọtutu urà-ya wezuga nwa-okorọbia ahu ka ọ ba n'ulo-ya,O were okwu ire-utọ nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya nufue ya.

22. Nwa-okorọbia ahu nējeso ya na mberede,Dika ehi si abia n'ob͕ub͕u-ya,Ma-ọbu dika nkpọrọ-ukwu si abia n'idọ-aka-na-nti nke onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya;

23. Rue mb͕e àkú gēji b͕apue imeju-ya;Dika nnunu si eme ngwa ibà n'ib͕udu,Ma ọ maghi na imegide ndu-ya ka ọ bu.

24. Ma ub͕u a, umum, genum nti,Tọ-kwa-nu nti n'ala n'okwu nile nke ọnum.

25. Ekwela ka obi-gi wezuga onwe-ya ba n'uzọ nile nke nwanyi ahu,Akpafula n'okporo-uzọ-ya nile.

26. N'ihi na ọ di ọtutu ndi emeruru aru ka o meworo ka ha da:E, ndi nwere ume ka ndi-ya nile eb͕uru eb͕u bu.