isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 19 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya,Kari onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'okwu, onye bu kwa onye-nzuzu.

2. Ọzọ, mb͕e nkpuru-obi nēnweghi ihe-ọmuma ọ dighi nma;Onye ukwu-ya nēme ngwa nēhie uzọ.

3. Uche b͕agọrọ ab͕agọ nke madu nēkpù uzọ-ya iru;Ọ bu kwa imegide Jehova ka obi-ya di ọku.

4. Àkù nātukwasiri madu ọtutu eyì:Ma onye nēnweghi ihe, anēkewapu ya n'ebe eyì-ya nọ.

5. Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ;Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume agaghi-ewepuga onwe-ya.

6. Ọtutu madu nāchọ ime ka iru onye amara aha-ya dajua:Onye ọ bula bu-kwa-ra onye nēnye onyinye eyì.

7. Umu-nne nile nke ob͕eye nākpọ ya asì:Ǹdi-eyì-ya gēsi aṅa ghara inọ ya n'ebe di anya kari!Ọ nāb͕aso okwu-ọnu di iche iche nke nābughi ihe.

8. Onye nēnweta obi amam-ihe nāhu nkpuru-obi-ya n'anya:Onye nēdebe nghọta gāchọta ezi ihe.

9. Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ;Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume gāla n'iyì.

10. Idi-pekepeke amaghi onye-nzuzu nma;Ò gēsi kwa aṅa ma orù nma ichi ndi-isi?

11. Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ;Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.

12. Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu;Ma dika igirigi n'elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di.

13. Ila-n'iyi nile n'ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu:Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu.

14. Ulo na àkù bu ihe-nketa ndi bu nna nārapu:Ma Jehova ka nwunye nke nwere uche sitere n'aka.

15. Ume-ngwu nēme ka oké ura dakwasi madu;Ọ bu kwa nkpuru-obi nke di ume-ngwu ka agu nāgu.

16. Onye nēdebe ihe enyere n'iwu nēdebe nkpuru-obi-ya:Onye nēleda uzọ-ya nile anya gānwu.

17. Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu,Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.

18. Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di;Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.

19. Onye oké ọnuma ganāra nra:N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ.

20. Nuru ndum-ọdu, nara kwa idọ-aka-na-nti,Ka i we mara ihe n'ikpe-azu-gi.

21. Ọtutu èchìchè di n'obi madu;Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.

22. Ihe nēme ka anāchọsi madu ike bu ebere-ya:Ọzọ, ob͕eye di nma kari onye-okwu-ugha.

23. Egwu Jehova nēdubà na ndu:Onye nwe-kwa-ra ya, ọ gānọ n'afọ-ojuju;Ihe ọjọ agaghi-eleta ya.

24. Onye-ume-ngwu esumiwo aka-ya n'ọkwa,Ọ gaghi-eweghachi ya ọbuná n'ọnu-ya.

25. Tie onye nākwa emò ihe, onye nēnweghi uche gāghọ onye nwere ezi uche:Ọzọ, bara onye-nghọta nba, ọ gāghọta ihe-ọmuma.

26. Onye nāpunara nna-ya ihe, nke nēme kwa ka nne-ya b͕alaga,Bu nwa nēweta ihere nēme kwa ka enwe iru-ihere.

27. Nwam, rapu inu idọ-aka-na-ntiNke nēme ka i si n'okwu-ọnu nile nke ihe-ọmuma waghari.

28. Onye-àmà nke jọb͕uru onwe-ya nākwa ikpé emò:Ọzọ, ọnu ndi nēmebi iwu nēloda ajọ ihe.

29. Edoziworo ndi nākwa emò ikpé di iche iche,Ọ bu kwa iti-ihe di iche iche ka edoziworo nye azu ndi-nzuzu.