isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 16 Bible Nso (IGBOB)

1. Madu nwe ido obi n'usoro:Ma n'aka Jehova ka ọziza ire sitere.

2. Uzọ nile nke onye ọ bula di ọcha n'anya-ya:Ma Onye nātùzi mọ nile nke madu ka Jehova bu.

3. Turu ọlu-gi nile rue Jehova aru,Èchìchè-gi nile ewe guzosie ike.

4. Ihe nile ka Jehova kpuru n'ihi Onwe-ya:E, ọbuná onye nēmebi iwu nāluru ubọchi ihe ọjọ ọlu.

5. Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu:Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

6. Eji ebere na ezi-okwu ekpuchi ajọ omume:Ọ bu kwa egwu Jehova ka madu ji esi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.

7. Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ,Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.

8. Ọ di nma inwe ihe ntà n'ezi omume,Kari inwe ọtutu ihe-omume ma ikpé ziri ezi adighi ya.

9. Obi madu nēchè uzọ-ya:Ma Jehova nēme ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.

10. Ọjuju-ase di n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke eze:Mb͕e ọ nēkpe ikpe ọnu-ya adighi-emekpu emekpu.

11. Ihe-ọtùtù na ihe-osìsì ziri ezi diri Jehova:Ọlu-Ya ka nkume-osìsì nile nke akpa bu.

12. Ọ buru ndi-eze ihe-árú ime nmebi-iwu:N'ihi na ezi omume ka oche-eze ji eguzosi ike.

13. Ihe nātọ ndi-eze utọ ka eb͕ub͕ere-ọnu ezi omume bu;Ọ bu kwa onye nēkwu ihe ziri ezi ka ha nāhu n'anya.

14. Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu:Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.

15. N'ìhè iru eze ka ndu di;Mb͕e ihe madu nātọ ya utọ, ọ di ka igwe-oji nke miri-ozuzo ikpe-azu.

16. Inweta amam-ihe, le ka o si di nma nke-uku kari ọla-edo ọma!Inweta nghọta kwa, le ka o si buru ihe anārọputa nke-uku kari ọla-ọcha!

17. Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ha:Onye nēdebe nkpuru-obi-ya nēche uzọ-ya.

18. N'iru ntipia ka npako nāga,Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.

19. Ọ di nma inwe mọ di ala n'etiti ndi ewedara n'ala,Kari isoro ndi-npako kesa ihe akwatara n'agha.

20. Onye nwere uche n'okwu Chineke gāchọta ezi ihe:Ọzọ, onye nātukwasi Jehova obi, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.

21. Onye obi-ya mara ihe, agākpọ ya onye-nghọta:Ọzọ, utọ eb͕ub͕ere-ọnu nātukwasiri nmuta ihe.

22. Isi-iyi nke ndu ka ezi uche bu n'ebe ndi-nwe-ya nọ:Ma idọ-aka-na-nti nke ndi uche-ha b͕agọrọ ab͕agọ bu uche b͕agọrọ ab͕agọ.

23. Obi onye mara ihe nēme ka ọnu-ya nwe uche,Ọ nātukwasi-kwa-ra eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nmuta.

24. Ub͕ub͕ọ-manu-aṅu ka okwu-ọnu utọ nile bu,Nke nātọ nkpuru-obi utọ, buru kwa ihe nāgwọ ọkpukpu n'ọria.

25. Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu,Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.

26. Ọchichọ-nkpuru-obi nke onye nādọb͕u onwe-ya n'ọlu adọb͕uworo ya onwe-ya n'ọlu;N'ihi na ọnu-ya erugidewo ya.

27. Onye jọb͕uru onwe-ya nēgwuputa ihe ọjọ:Ọ bu kwa n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka ihe dika ọku nāru aru di.

28. Onye nāb͕akuta Chineke azu nēzisa ise-okwu:Ọzọ, onye nēkwu okwu-azu nēkewa ezi eyì.

29. Onye nēme ihe-ike nārà madu-ibe-ya urà,Nēme kwa ka o je ije n'uzọ nādighi nma.

30. Onye nātachi anya-ya abua ichè èchìchè ib͕akuta Chineke azu,Onye nātabi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, o mezuwo ihe ọjọ.

31. Okpu-eze nke mara nma ka isi-awọ bu,N'uzọ ezi omume ka agāhu ya.

32. Ọ di nma, bú onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ, kari dike:Ọ di kwa nma, bú onye nāchi mọ-ya, kari onye nēwere obodo n'agha.

33. Anēfe nzà,Ma n'aka Jehova ka ikpé-ya nile sitere.