isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 28 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndi nēmebi iwu ab͕alagawo mb͕e ọ dighi onye nāchu ha:Ma ndi ezi omume nwere ntukwasi-obi dika ọdum.

2. N'ihi njehie nke ala ha di ọtutu, bú ndi-isi-ya:Ma site na madu nwere nghọta na ihe-ọmuma ka ọnọdu-ya gādigide ogologo mb͕e.

3. Nwoke bu ob͕eye nke nēmeb͕u ndi nēnweghi ike,Ọ di ka miri-ozuzo nke nāzachapu ihe, nri we ghara idi.

4. Ndi nārapu iwu nēto onye nēmebi iwu,Ma ndi nēdebe iwu nāluso ha ọ̀gù.

5. Ndi ọjọ adighi-aghọta ikpé:Ma ndi nāchọ Jehova nāghọta ihe nile.

6. Ọ di nma, bú ob͕eye nke nēje ije n'izu-okè-ya,Kari onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ-ya abua, ọ bu ezie na onye ahu bu ọgaranya.

7. Onye nēdebe iwu bu nwa nāghọta ihe:Ma onye bu eyì ndi nēribiga ihe ókè nētiye nna-ya n'onọdu-ihere.

8. Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa,Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.

9. Onye nēwezuga nti-ya n'inu iwu,Ọbuná ekpere-ya bu ihe-árú.

10. Onye nēme ka ndi ziri ezi waghari n'uzọ ọjọ,N'olùlù nke aka ya ka ya onwe-ya gādabà:Ma ndi zuru okè gēketa ezi ihe.

11. Onye mara ihe n'anya-ya ka ọgaranya bu;Ma onye nēnweghi ike nke nāghọta ihe nēgwuputa ala-ya.

12. Mb͕e obi ndi ezi omume nātọ ha utọ, ọtutu ima-nma di:Ma mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, agāchọ madu achọ.

13. Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gaghi-agara ya:Ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n'aru ya.

14. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātu oké egwu mb͕e nile:Ma onye nēme ka obi-ya sie ike gādabà n'ihe ọjọ.

15. Ọdum nke nāb͕o uja na anu-ọhia bear nke nāb͕aghariKa onye nēmebi iwu nke nāchi ndi nēnweghi ike bu.

16. Gi onye-ndú nke nghọta kọrọ, nke bu kwa onye-nmeb͕u uku,Onye nākpọ urù nēzighi ezi asì gēme ka ubọchi-ya nile di ogologo.

17. Madu nke ọbara madu nānyib͕u,Rue olùlù ka ọ gāb͕alaga; ka onye ọ bula ghara ijide ya.

18. Onye nēje ije n'izu-okè ka agāzọputa:Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uzọ abua gāda ngwa ngwa.

19. Onye nālu ala-ubi-ya, afọ gēju ya na nri:Ma onye nāb͕aso ihe-efu di iche iche, afọ gēju ya n'ibu-ob͕eye.

20. Onye ọ bula nke kwesiri ntukwasi-obi gēnwe ọtutu ngọzi:Ma onye nānukpọ onwe-ya ibu ọgaranya, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

21. Imata iru madu n'ikpé adighi nma:Ọ dighi kwa nma ka madu ji n'ihi iberibe nri nējehie.

22. Onye nāb͕aso àkù ka onye nwere anya ọjọ bu,Ma ọ maghi na ihe-ukọ gābiakute ya.

23. Onye nābara madu nba gēmesia huta amaraKari onye nēkwu ire-utọ.

24. Onye nānapu nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe n'ike, si, Ọ dighi njehie ọ bu;Onye ejikọtaworo ya na onye-nbibi ka ọ bu.

25. Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu:Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba.

26. Onye nātukwasi obi n'obi nke aka ya, onye ahu bu onye-nzuzu:Ma onye nēje ije n'amam-ihe, onye ahu ka agēme ka o wepuga onwe-ya.

27. Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya:Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu.

28. Mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, madu ezobe onwe-ya:Ma mb͕e ha nāla n'iyì, ndi ezi omume aba uba.