1. Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti.
2. Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm?Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere?
3. Enyela ndinyom ike-gi,Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile.
4. Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine;Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di?
5. Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ,We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala.
6. Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya,Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine:
7. Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu,Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ.
8. Saghere onye-ob͕i ọnu-gi,N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì.
9. Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume,Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye.
10. Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya?N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku.
11. Obi di-ya atukwasiwo ya obi,Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu.
12. Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ,Ubọchi nile nke ndu-ya.
13. Ọ chọwo aji-anu na flax,We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.
14. Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia;Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya.
15. O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa,We nye ulo-ya nri,Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha.
16. O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya:Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine.
17. O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké,Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume.
18. Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma:Oriọna-ya adighi-anyu n'abali.
19. Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho,Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike.
20. Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala;E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru.
21. Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe;N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.
22. Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya;Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu.
23. Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu,Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala.
24. Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya;Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia.
25. Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya;Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì.
26. Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe;Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya.
27. Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma,Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri.
28. Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma;Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si:
29. Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma,Ma gi onwe-gi kachasi ha nile.
30. Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu:Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto
31. Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara;Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile.