isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 2 Bible Nso (IGBOB)

1. Nwam, ọ buru na i nara okwu-ọnum nile,Ọ buru kwa na i zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ;

2. Itọrọ amam-ihe nti-gi n'ala,We wezuga obi-gi inwe nghọta;

3. E, ọ buru na ọ bu nmata ka i nākpọku,Ọ buru kwa na ọ bu nghọta ka i nēweliri olu-gi;

4. Ọ buru na i chọ ya dika ọla-ọcha,Ọ buru kwa na ọ bu dika àkù zoro ezo ka i nēgwuputa ya:

5. Mb͕e ahu ka i gāghọta egwu Jehova,Ọ bu kwa ihe-ọmuma Chineke ka i gāchọta.

6. N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe;N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:

7. O nēzobere ndi ziri ezi nzube-ihe,Ọ bu ọta ndi nēje ije n'izu-okè nwere;

8. Iche okporo-uzọ nile nke ikpé,Ọ bu kwa uzọ ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe.

9. Mb͕e ahu ka i gāghọta ezi omume na ikpé,Na izi-ezi nile, e, ezi uzọ ọ bula.

10. N'ihi na amam-ihe gābà n'obi-gi,Ihe-ọmuma gādi kwa nkpuru-obì-gi utọ;

11. Ìzùzù ganēche gi nche,Nghọta gēchebe gi:

12. Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ,N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;

13. Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi,Ka ha we je ije n'uzọ nile nke ọchichiri;

14. Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ,Ha nēteghari egwú ọṅù n'ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ;

15. Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ,Ha nēsihie kwa n'uzọ nile ha:

16. Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi,N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;

17. Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ,Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:

18. N'ihi na uzọ iridaru ọnwu ka ulo-ya bu,Ọ bu kwa uzọ iridaru n'ebe ndi nādighi ndu nọ ka uzọ-ya nile bu.

19. Ndi nile ndi nābakuru ya, ha adighi-alata,Ha adighi-eru kwa okporo-uzọ nile nke ndu:

20. Ka i we je ije n'uzọ ndi di nma,Debe kwa okporo-uzọ nile nke ndi ezi omume.

21. N'ihi na ndi ziri ezi gēbi n'uwa,Ndi zuru okè gāfọdu kwa nime ya.