isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 20 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu;Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe.

2. Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu:Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya.

3. Ọ buru madu nsọpuru ikwusi ilu ọ̀gù:Ma onye ọ bula nke uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ganālusi ọ̀gù ike.

4. N'ihi na ọ bu mb͕e oyi nātu, onye-ume-ngwu agaghi-alu ọlu ubi;Ọ gāriọ aririọ na mb͕e owuwe-ihe-ubi, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe.

5. Miri nke miri emi ka ndum-ọdu n'obi madu bu;Ma onye-nghọta gādọputa ya.

6. Ọtutu madu nākpọsa, onye ọ bula ebere nke aka ya:Ma onye kwesiri ntukwasi-obi, ònye gāchọputa ya?

7. Onye ezi omume nke nējeghari n'izu-okè-ya,Ndi ihe nāgara nke-ọma ka umu-ya nke gānọchi ya gābu.

8. Eze nke nānọkwasi n'oche ikpéJi anya-ya abua afuchapu ihe ọjọ nile.

9. Ònye gāsi, Emewom ka obim di ọcha,Aghọwom onye di ọcha pua na nmehiem?

10. Uzọ nkume-isì-ihe abua, na uzọ ephah abua,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.

11. Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n'omume-ya nile,Ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi.

12. Nti nke nānu ihe, na anya nke nāhu uzọ,Jehova emewo ọbuná ha abua.

13. Ahula urá n'anya, ka ewe ghara inapu gi ihe nile;Meghe anya-gi abua, rijue nri afọ.

14. Ọ jọrọ njọ, ọ jọrọ njọ, ka onye nāzù azù nāsi:Ma mb͕e ọ laworo n'ulo-ya, mb͕e ahu ka ọ nānya isi.

15. Ọla-edo di, na ọtutu ruby:Ma ihe di oké ọnu-ahia ka eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu ihe-ọmuma bu.

16. Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe;N'ọnọdu ndi mba ọzọ nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.

17. Ọ nātọ madu utọ, bú nri okwu-ugha;Ma emesia nkpuru-ájá gēju ya ọnu.

18. Èchìchè nile nēji ndum-ọdu guzosi ike:Gi were kwa ezi ndum-ọdu bue agha.

19. O nēkpughe ìzù nzuzo, bú onye nējeghari dika onye nāb͕a àmà ọjọ.Agwakọta-kwa-la onwe-gi n'onye ji eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua arafu madu.

20. Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya,Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri.

21. Ihe-nketa nke anānara ọsọsọ na mbu;Agaghi-agọzi kwa ikpe-azu-ya.

22. Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ:Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi.

23. Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ nkume-isì-ihe abua bu;Ihe-osìsì aghughọ adighi kwa nma.

24. N'aka Jehova ka nzọ-ukwu nile nke madu nēsite;Màdu gēsi kwa aṅa ghọta uzọ-ya?

25. Ọnyà mara madu ma ọ buru na o were ọsọsọ si, Ọ di nsọ,Ma mb͕e ọ kwesiri nkwa o we ju ajuju.

26. Ọ nāfuchapu ndi nēmebi iwu, bú eze mara ihe,Ọ nēme kwa ka wheel nsucha-ọka laghachi n'elu ha.

27. Oriọna Jehova ka ume ndu madu bu,Nēgwuputa ime-ime-ala afọ nile.

28. Ebere na ezi-okwu nēchebe eze:O ji kwa ebere akwagide oche-eze-ya.

29. Ima-nma umu-okorọbia ka ike-ha bu:Ihe-nsọpuru ndi-okenye ka isi-awọ bu kwa.

30. Ufiri-utali nke nēmeru aru nēchichapu ihe ọjọ:Iti-ihe nēru kwa ime-ime-ala afọ.