isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 3 Bible Nso (IGBOB)

1. Nwam, echezọla iwum;Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu:

2. N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu,Na udo, ka ha gātukwasiri gi.

3. Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi:Ke ha n'olu-gi;De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi:

4. Chọta kwa amara na ezi ucheN'anya Chineke na madu.

5. Tukwasi Jehova obi-gi nile,Adabere-kwa-la nghọta-gi:

6. N'uzọ-gi nile mara Ya,Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.

7. Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi;Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi:

8. Ya buru ihe nāgwọ otubo-gi,Ya buru kwa umi diri ọkpukpu-gi nile.

9. Sọpuru Jehova site n'àkù-gi,Site kwa na nkpuru mbu nke ihe-ọmume-gi nile:

10. Ọba-gi nile gējuputa kwa n'ihe-nriju-afọ,Ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi nile gētiwa kwa na manya-vine ọhu.

11. Nwam, ajula idọ-aka-na-nti nke Jehova:Ike agwu-kwa-la gi n'iba-nba-Ya:

12. N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba;Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.

13. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke chọtaworo amam-ihe bu,Ya na madu nke nēnweputa nghọta.

14. N'ihi na ọzuzú-ahia-ya di nma kari ọzuzú-ahia ọla-ọcha,Urù-ya di nma kari ọla-edo ọma.

15. Ihe di oké ọnu-ahia ka ọ bu kari ruby:Ihe nile kwa nke nātọ gi utọ, ha agaghi-ara ka ya.

16. Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya;N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di.

17. Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ,Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.

18. Osisi nēnye ndu ka ọ buru ndi nējide ya aka:E, onye ọ bula nke nējisi ya aka ike bu onye ihe nāgara nke-ọma.

19. Jehova jiri amam-ihe tọ ntọ-ala uwa;O doziri elu-igwe site na nghọta.

20. Ejiri ihe-ọmuma-Ya kewa ob͕u-miri nile,Mbara-ígwé nile ji kwa ya atuda igirigi.

21. Nwam, ekwela ka ha si n'anya-gi abua wezuga onwe-ha;Chebe nzube-ihe na ìzùzù;

22. Ha gābu-kwa-ra nkpuru-obi-gi ndu,Bu-kwa-ra olu-gi amara.

23. Mb͕e ahu ka i ganēje ije n'uzọ-gi na ntukwasi-obi,I gaghi-akpọbì kwa ukwu-gi,

24. Ọ buru na i dina ala, i gaghi-atu oké egwu:E, i gēdina ala, ura-gi gātọ kwa utọ.

25. Atula egwu site n'oké egwu mberede,Ma-ọbu site n'ikuku siri ike nke ndi nēmebi iwu, mb͕e ọ nābia:

26. N'ihi na Jehova gābu ntukwasi-obi-gi,Ọ gēdebe kwa ukwu-gi ka aghara ijide ya.

27. Eb͕ochila ezi ihe na ndi ọ diri,Mb͕e ọ diri ike aka-gi ime ya.

28. Asila madu-ibe-gi, Je, lata,Echi ka m'gēnye gi;Mb͕e ọ di n'aka-gi.

29. Echèputala ihe ọjọ megide madu-ibe-gi,Ebe onye ahu nēbi gi nso na ntukwasi-obi.

30. Gi na madu esela okwu n'efu,Ma ọ buru na o mesoghi gi ihe ọjọ.

31. Ekwosola onye neme ihe-ike ekworo,Arọputa-kwa-la otù efu n'uzọ-ya nile.

32. N'ihi na ihe-árú n'anya Jehova ka onye sihiere esihie bu:Ma n'aka ndi ziri ezi ka ìzù nzuzo Ya di.

33. Ọbubu-ọnu Jehova di n'ulo onye nēmebi iwu;Ma ebe-obibi ndi ezi omume ka Ọ nāgọzi.

34. Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò,Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara.

35. Nsọpuru ka ndi mara ihe gēketa;Ma ndi-nzuzu nēbuli nlelì.