isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 14 Bible Nso (IGBOB)

1. Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya:Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ji aka-ya abua akwada ya.

2. Onye nēje ije n'izi-ezi-ya nātu egwu Jehova:Ma onye nēsihie n'uzọ-ya nile nēleda Ya anya.

3. N'ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ome npako di:Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha.

4. Mb͕e ehi nādighi, ulo anāzù ehi nādi ọcha:Ma ihe-omume riri nne nēsite n'ike ehi.

5. Onye-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi adighi-ekwu okwu-ugha:Ma onye-àmà okwu-ugha nēkupu okwu-ugha dika ume.

6. Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya:Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe.

7. Je na ncherita-iru onye-nzuzu,I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya.

8. Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya:Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ.

9. Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha:Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di.

10. Obi mara ilu nke aka ya;Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya.

11. Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu:Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku.

12. Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu,Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.

13. Ọbuná n'ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u;Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú.

14. Site n'uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n'obi:Ma ọ bu site n'onwe-ya ka afọ gēju ezi madu.

15. Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula:Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya.

16. Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya:Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi.

17. Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ:Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì.

18. Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ:Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi.

19. Ndi ọjọ erudawo ala n'iru ndi ezi madu;Ndi nēmebi iwu kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke onye ezi omume.

20. Ọbuná onye-ab͕ata-obi nke ob͕eye nākpọ ya asì:Ma ndi nāhu ọgaranya n'anya di ọtutu.

21. Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie:Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.

22. Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ?Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe.

23. Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya:Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ.

24. Okpu-eze nke ndi mara ihe bu àkù-ha:Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu nání uche b͕agọrọ ab͕agọ.

25. Onye nānaputa nkpuru-obi di iche iche ka onye-àmà nke nēkwu ezi-okwu bu:Ma onye nēkupu ọtutu okwu-ugha dika ume nāghọ aghughọ.

26. N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di:Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà.

27. Egwu Jehova bu isi-iyi nke ndu,Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi.

28. N'uba nke ndi ọ bula ka ima-nma eze di:Ma n'ukọ mba ọ bula ka nbibi onye-isi di.

29. Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta:Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ.

30. Ndu nke anu-aru ka obi agwọrọ ọria-ya bu:Ma ire-ure nke ọkpukpu nile ka ekworo bu.

31. Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta:Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu.

32. Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya:Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu.

33. N'obi onye-nghọta ka amam-ihe nānọgide:Ma n'etiti ndi-nzuzu ka ọ nēme ka amara ya.

34. Ezi omume nēbuli mba:Ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu.

35. Ihe orù nwere uche nātọ eze utọ:Ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya gādi n'aru onye nēweta ihere.