isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 17 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ di nma iri iberibe achicha kpọrọ nku, ma inọ-n'udo adi ya,Kari ulo juputara n'àjà anēri nālu ọ̀gù.

2. Orù nke nwere uche gāchi nwa madu nēweta ihere,Ọ bu kwa n'etiti umu-nne nwa ahu ka ọ gēkere ihe-nketa.

3. Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo:Ma Onye nānwa obi bu Jehova.

4. Onye nēme ihe ọjọ nātọ nti n'ala n'eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ajọ ihe;Onye-okwu-ugha nāṅa nti ire nēkwu ihe-ila-n'iyì.

5. Onye nākwa ob͕eye emò atawo Onye meworo ya uta:Onye nāṅuri ọṅu bayere nhuju-anya ndi ọzọ, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.

6. Okpu-eze ndi-okenye ka umu umu bu;Ọzọ, ima-nma nke umu bu nna-ha.

7. Ọ maghi nma n'ebe onye-nzuzu nọ, bú eb͕ub͕ere-ọnu nēkwu ihe makarisiri nma:Èb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu-ugha gēsi kwa aṅa ma nma n'ebe onye amara aha-ya nọ?

8. Nkume amara ka iri-ngo bu n'anya ndi-nwe-ya:Ebe ọ bula ọ nēche iru ọ nāgara ya.

9. Onye nēkpuchi njehie nāchọ ihu-n'anya:Ma onye nēkwu okwu mb͕e na mb͕e nēkewa ezi eyì.

10. Ibasi-nba-ike nābàmi nime onye-nghọtaKari ka ọgu otiti ise gābà nime onye-nzuzu.

11. Nání nnupu-isi ka onye ọjọ nāchọ;Ọ bu kwa onye-ozi nēnweghi obi-ebere ka agēziga megide ya.

12. Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu,Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.

13. Onye nēnyeghachi ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe,Ihe ọjọ agaghi-apu n'ulo-ya.

14. Dika mb͕e madu nērùpu miri, otú a ka isi-nmalite ise-okwu di:N'ihi ya tutu ilu-ọ̀gù esie ike rapu ya.

15. Onye nāgu onye nēmebi iwu n'onye ezi omume, na onye nāma onye ezi omume ikpe,Ihe-árú n'anya Jehova ka ha abua bu n'otù.

16. N'ìhi gini kwa ka ego-ọzùzù-ahia di n'aka onye-nzuzu izuta amam-ihe,Mb͕e obi amam-ihe nādighi?

17. Na mb͕e nile ka eyì nāhu n'anya,Anāmu kwa-nwa-nne bayere ahuhu.

18. Madu nke obi amam-ihe kọrọ nānara madu n'aka ibu onye-mbe,Ọ nāghọ onye nọ na mbe n'iru madu-ibe-ya.

19. Onye nāhu njehie n'anya nāhu ilu-ọ̀gù n'anya:Onye nēme ka ọnu-uzọ-ya di elu nāchọ ntipia.

20. Onye obi-ya b͕agọrọ ab͕agọ adighi-achọta ezi ihe:Ọzọ, onye nāb͕anwe onwe-ya n'ire-ya gādabà n'ihe ọjọ.

21. Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú:Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu.

22. Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma:Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.

23. Ihe-iri-ngo ka onye nēmebi iwu nēweputa n'uwe-obi-ya,Iwezuga uzọ nile nke ikpé.

24. N'iru onye-nghọta ka amam-ihe di:Ma anya abua nke onye-nzuzu di na nsọtu uwa.

25. Ihe nākpasu nna-ya iwe ka nwa nzuzu bu,Ọ bu-kwa-ra nwanyi muru ya ihe-ilu.

26. Ọzọ, iri onye ezi omume nra adighi nma,Ọ dighi kwa nma itib͕u ndi amara aha-ha n'ihi izi-ezi-ha.

27. Onye nēb͕ochi okwu-ọnu-ya mara ihe-ọmuma:Ọzọ, onye mọ-ya juru ajuru bu onye-nghọta.

28. Ọbuná onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ, mb͕e ọ nāb͕a, anāgu ya n'onye mara ihe:Onye nēkpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye-nghọta.