isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 5 Bible Nso (IGBOB)

1. Nwam, ṅa nti n'amam-ihem;Tọ nti-gi n'ala nye nghọtam:

2. Ka i we debe ìzùzù di iche iche,Ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi we chebe kwa ihe-ọmuma.

3. N'ihi na eb͕ub͕ere-ọnu nke nwayi nābughi nwunye-gi nābusi manu-aṅu,Ihe kwọrọ murumuru kari manu ka okpo-ọnu-ya di kwa:

4. Ma ikpe-azu-ya nēlu ilu dika wormwood,Ọ di nkọ dika mma-agha iru abua.

5. Ukwu-ya abua nārida n'ọnwu;Ala-mọ ka nzọ-ukwu-ya nile nējidesi ike;

6. Ka i we ghara ime ka okporo-uzọ ndu di lari:Uzọ-ya nile emewo nkpatu, i gaghi-ama ha.

7. Ma ub͕u a, umum, gēnum nti,Unu esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-unu.

8. Me ka uzọ-gi di anya n'ebe ọ nọ,Abiaru-kwa-la ọnu-uzọ ulo-ya nso:

9. Ka i we ghara inye ndi ọzọ ebube-gi,Ka i we ghara kwa inye onye nēnweghi obi-ebere arọ-gi nile:

10. Ka afọ we ghara iju ndi nābughi ndi nke gi n'ume-gi;Ka ihe nile i dọb͕uru onwe-gi n'ọlu inweta we ghara kwa idi n'ulo onye nābughi nke gi;

11. I we sua udè n'ikpe-azu-gi,Mb͕e anu-aru-gi na aru-gi gāgwusi,

12. I we si, Le ka m'siworo kpọ idọ-aka-na-nti asì nke-uku,Ọ bu kwa iba-nba ka obim leliworo anya;

13. Egeghkwam nti n'olu ndi-ozizim,Ọ bughi kwa n'ebe ndi nēzím ihe nọ ka m'tọworo ntim n'ala!

14. Ọ fọduru ihe ntà ka m'nọzue n'ihe ọjọ nileN'etiti nkpọkọta na nzukọ ndi nkem.

15. Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi,Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi.

16. Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí?Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi?

17. Ka ha diri nání gi onwe-gi,Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha.

18. Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi;Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia.

19. Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma,Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile;Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile.

20. Ma n'ìhi gini ka i gēji nwayi nābughi nwunye-gi waghari, nwam?N'ìhi gini ka i gāb͕aku nwayi nābughi nwunye-gi obi?

21. N'ihi na n'iru anya Jehova ka uzọ nile nke madu di,Okporo-uzọ-ya nile ka Ọ nēme ka ha di lari.

22. Ajọ omume nile nke aka ya gānwude onye ahu nēmebi iwu,Agēji kwa udọ̀ nile nke nmehie-ya jidesie ya ike.