isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 9 Bible Nso (IGBOB)

1. Amam-ihe ewuwo ulo-ya,Ọ waputawo ogidi asa ya:

2. O b͕uwo anu-ob͕ub͕u-ya; ọ gwawo manya-vine-ya agwa;O dowo kwa table-ya n'usoro.

3. O zipuwo umu-ab͕ọghọ-ya, ọ nākpọ òkùN'elu ebe nile di elu nke obodo, si,

4. Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a:Onye obi amam-ihe kọrọ, amam-ihe asiwo ya,

5. Bianu, rienu nrim ufọdu,Ṅu-kwa-nu manya-vine ufọdu nke m'gwaworo agwa.

6. Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu;Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta.

7. Onye nādọ onye nākwa emò aka na nti nēwetara onwe-ya nlelì:Ọzọ, onye nābara onye nēmebi iwu nba nēwetara onwe-ya ọlu-ya.

8. Abarala onye nākwa emò nba, ka o we ghara ikpọ gi asì:Bara onye mara ihe nba, ọ gāhu kwa gi n'anya.

9. Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari:Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya.

10. Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu:Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta.

11. N'ihi na site na mu ka ubọchi-gi gāba uba,Agātukwasi-kwa-ra gi arọ ndu.

12. Ọ buru na i mara ihe, i maworo onwe-gi ihe:Ọ buru kwa na i kwa emò, nání gi gēbu ya.

13. Nwanyi nzuzu nēme nkpọtu;Onye nēnweghi uche ka ọ bu, ọ maghi kwa ihe ọ bula.

14. Ọ nānọdu kwa n'ọnu-uzọ ulo-ya,N'elu oche n'ebe nile di elu nke obodo,

15. Ikpọ ndi nāgabiga n'uzọ òkù,Bú ndi nāgazi agazi n'okporo-uzọ-ha,

16. Onye ọ bula nēnweghi uche, ya wezuga onwe-ya bata n'ebe a:Ọzọ, onye obi amam-ihe kọrọ, nwanyi ahu asiwo ya,

17. Miri ezutara ezuta nātọ utọ,Nri eriri na nzuzo di utọ.