isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 8 Bible Nso (IGBOB)

1. Amam-ihe, ọ̀ dighi-akpọ òkù?Nghọta kwa, ọ̀ dighi-eme ka olu-ya da udà?

2. N'elu ebe nile di elu n'akuku uzọ,N'ab͕ata uzọ nile, ka O guzoworo onwe-ya;

3. N'akuku ọnu-uzọ-ama nile, n'ọnu amá obodo,Na nbata ọnu-uzọ nile, ka ọ nētisi nkpu ike, si,

4. Ọ bu unu, madu, ka m'nākpọku;Olum nādaku kwa umu madu.

5. Unu ndi nēnweghi uche, ghọtanu ezi uche;Unu ndi-nzuzu kwa, menu ka obi-unu ghọta ihe.

6. Nurunu, n'ihi na isi ihe di iche iche ka m'nēkwu;Nsaghe eb͕ub͕ere-ọnum gābu kwa ihe di iche iche ziri ezi.

7. N'ihi na ezi-okwu ka okpo-ọnum nēkwu dika onye nātughari uche;Ọzọ, ihe-árú nke eb͕ub͕ere-ọnum ka nmebi-iwu bu.

8. N'ezi omume ka okwu nile nke ọnum di;Ọ dighi ihe nēzighi ezi ma-ọbu ihe b͕agọrọ ab͕agọ di nime ha.

9. Ha nile putara ìhè n'ebe onye-nghọta nọ,Ha zi-kwa-ra ezi n'ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ.

10. Nara idọ-aka-na-ntim, anara-kwa-la ọla-ọcha;Nara kwa ihe-ọmuma kari ọla-edo ọma arọputara arọputa.

11. N'ihi na amam-ihe di nma kari ruby;Ihe nile kwa nke nātọ madu utọ, ha agaghi-ara ka ya.

12. Mu onwem, bú amam-ihe, emewo ezi uche ebe-obibim,Ọ bu kwa ọmuma ihe-ìzùzù di iche iche ka m'nāchọputa.

13. Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì:Npako, na nganga, na uzo ọjọ,Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì.

14. Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe:Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike.

15. Mu ka ndi-eze ji abu eze,Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume.

16. Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi,Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa.

17. Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya;Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam.

18. Àkù na nsọpuru di n'akam;E, àkù nke nādigide na ezi omume.

19. Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha;Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa.

20. N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije,N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé:

21. Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi,Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha.

22. Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya,Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu.

23. Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu,Tutu uwa adi.

24. Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram;Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri.

25. Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala,Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram:

26. Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo,Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi.

27. Mb͕e O doziri elu-igwe, n'ebe ahu ka m'nọ:Mb͕e O nyere ukpuru, si, Ka ihe b͕ara buruburu dikwasi n'iru ob͕u-miri:

28. Mb͕e Ọ mere ka mbara-ígwé sie ike n'elu:Mb͕e emere ka isi-iyi nile nke ob͕u-miri di ike:

29. Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya,Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya:Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru:

30. Anọkwam n'akuku Ya, dika onye-ọ̀kà:M'we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi,Nēgwuri egwú n'iru Ya mb͕e nile;

31. Nēgwuri egwú n'elu-uwa dum madu bi n'uwa-Ya;Ihe nātọm utọ di kwa n'ebe umu madu nọ.

32. Ma ub͕u a, umum, genum nti:N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.

33. Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe,Unu eze-kwa-la ya ndu.

34. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu,N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi,Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile.

35. N'ihi na onye nāchọtam achọtawo ndu,Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ.