isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 22 Bible Nso (IGBOB)

1. Ihe anārọputa ka ezi aha bu kari ọtutu àkù,Amara di kwa nma kari ọla-ọcha na ọla-edo.

2. Ọgaranya na ob͕eye ezutewo:Onye meworo ha nile bu Jehova.

3. Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya:Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.

4. Ọkpukpu-ọlu nke obi ume-ala na egwu JehovaBu àkù, na nsọpuru, na ndu.

5. Ogwu na ib͕udu di n'uzọ onye b͕agọrọ ab͕agọ n'obi:Onye nēdebe nkpuru-obi-ya gānọ ha n'ebe di anya.

6. Zulite nwata dika uzọ-ya si di,Ọbuná mb͕e o mere okenye ọ gaghi-esi nime ya wezuga onwe-ya.

7. Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye,Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye.

8. Onye nāgha ajọ omume dika nkpuru gēwe ajọ ihe dika ihe-ubi:Nkpa-n'aka nke nrubiga ókè nke iwe-ya gāgwusi kwa.

9. Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi;N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike.

10. Chupu onye nākwa emò, ise-okwu gāpu kwa;E, iru-uka na nlelì gākwusi.

11. Onye nāhu idi-ọcha nke obi n'anya,Eyì-ya ka eze gābu n'ihi amara nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua.

12. Anya abua nke Jehova echebewo onye-ihe-ọmuma,Ma Ọ nēkpù okwu nile nke onye-nghọb͕u iru.

13. Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'èzí:N'etiti amá ka agēb͕um.

14. Ọbù nke miri emi ka ọnu ndinyom nābughi nwunye-gi bu:Onye Jehova nēwesa oké iwe gādabà nime ya.

15. Uche b͕agọrọ ab͕agọ bu ihe ekekọtaworo n'obi nwata;Ma nkpa-n'aka nke idọ-aka-na-nti gēme ka ọ di anya n'ebe ọ nọ.

16. Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike ime ka àkù nke aka ya ba uba,Ya na onye nēnye ọgaranya ihe gābiaru nání ihe-ukọ.

17. Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe,Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam.

18. N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi,Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.

19. Ọ bu ka ntukwasi-obi-gi we di na JehovaKa m'meworo ka i mara ha ta, ọbuná gi onwe-gi.

20. Èdetaghm i isi iheNime ndum-ọdu di iche iche na ihe-ọmuma;

21. Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu,Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu?

22. Anapula onye nēnweghi ike ihe n'ike, n'ihi na onye nēnweghi ike ka ọ bu,Azọpia-kwa-la onye ewedara n'ala n'ọnu-uzọ-ama:

23. N'ihi na Jehova gēkpe ọnu-ha,We punara ndi ahu ndu, bú ndi nāpunara ha ihe.

24. Gi na onye-iwe abula eyì;I gaghi-eso kwa onye-ọnuma ba n'ulo:

25. Ka i we ghara imuta uzọ-ya nile,We wetara nkpuru-obi-gi ọnyà.

26. Abula otù nime ndi gānara madu n'aka,Abu-kwa-la otù nime ndi nọ na mbe bayere ugwọ di iche iche.

27. Ọ buru na i nweghi ihe ikwu ugwọ,N'ìhi gini ka ọ gānapu ihe-ndina-gi n'okpuru gi?

28. Ewezugala ókè-ala nke diworo mb͕e ebighi-ebi,Nke nna-gi-hà kpaworo.

29. Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya;Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha.