isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29
  30. 30
  31. 31

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ilu 29 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike,N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.

2. Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri:Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume.

3. Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria:Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì.

4. Eze nēji ikpé ziri ezi eme ka ala-ya guzo:Ma onye nānara onyinye nākwada ya.

5. Nwoke nke nāgwa madu-ibe-ya okwu ire-utọNāb͕asara nzọ-ukwu-ya nile ub͕u.

6. Na njehie onye ọjọ ka ọnyà di:Ma onye ezi omume nēti nkpu ọṅù nāṅuri kwa.

7. Onye ezi omume nāmata okwu-ikpe nke ndi nēnweghi ike:Onye nēmebi iwu adighi-aghọta ihe-ọmuma.

8. Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo:Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.

9. Ọ buru na onye mara ihe esoro onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ kpe ikpe,Ma o nwere ọnuma ma ọ chìri ọchì, izu-ike adighi kwa.

10. Ndi-ọbara nākpọ onye zuru okè asì:Ma ndi ziri ezi nāchọ ọdi-nma nkpuru-obi-ya.

11. Mọ nile nke onwe-ya ka onye-nzuzu nēme ka ọ puta ìhè:Ma onye mara ihe nēb͕ochi mọ-ya, nēme kwa ka ọ dajua.

12. Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha,Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.

13. Ob͕eye na onye-nmeb͕u ezutewo:Onye nēnye anya ha abua ìhè bu Jehova.

14. Eze nke nēkpe ndi nēnweghi ike ikpe n'ikwesi-ntukwasi-obi,Oche-eze-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.

15. Nkpa-n'aka na iba-nba nēnye amam-ihe:Ma nwata nke anārapu n'onwe-ya nēme ka ihere me nne-ya.

16. Mb͕e ndi nēmebi iwu nāba uba kari, njehie nāba kwa uba kari:Ma ndi ezi omume gēlekwasi ọdida-ha.

17. Dọ nwa-gi aka na nti, ọ gēme kwa ka i zu ike;E, ọ gēnye nkpuru-obi-gi ihe-utọ.

18. Mb͕e ọhù nādighi, ndi ala ahu adighi nchikọta:Ma onye nēdebe iwu, ihe nāgara onye ahu nke-ọma.

19. Ọ bughi okwu agēji dọ orù aka na nti:N'ihi na ọ bu ezie na ọ nāghọta, ma ọ̀ dighi ihe ọ nāza.

20. Ì huwo onye ọ bula nānukpọ onwe-ya n'okwu-ya nile?Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.

21. Onye zutọworo orù-ya site na nwata,N'ikpe-azu-ya orù ahu gāghọ kwa nwa.

22. Onye-iwe nākpali ise-okwu,Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.

23. Npako madu gēme ka ọ di ala:Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.

24. Onye ya na onye-ori nēkekọ ihe nākpọ nkpuru-obi ya onwe-ya asì:Ọb͕ub͕a-iyi ka ọ nānu, ma ọ dighi-egosi ihe ọ bula.

25. Egwu madu nēweta ọnyà:Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme ka ọ nọ n'elu.

26. Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi:Ma n'aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia.