isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Ehab nwere ọgu umu-ndikom atọ na iri nime Sameria. Jihu we de akwukwọ ziga na Sameria, zigara ndi-isi Jezreel, bú ndi-okenye, ziga-kwa-ra ndi nāzù umu Ehab, si,

2. Ma ub͕u a, mb͕e akwukwọ a bara n'aka-unu, ebe umu onye-nwe-unu nọ n'etiti unu, ebe ub͕ọ-ala na inyinya di kwa n'etiti unu, na obodo ewusiri ike, na ihe-agha;

3. leputanu onye ahu nke kachasi nma, nke zi-kwa-ra ezi karisia, nime umu-ndikom onye-nwe-unu, donu ya n'elu oche-eze nna-ya, buere ulo onye-nwe-unu agha.

4. Ha we tua egwu nke-uku ri nne, si, Le, eze abua eguzoghi n'iru ya: àyi onwe-ayi gēsi kwa aṅa guzo?

5. Onye nke bu onye-isi ulo, na onye nke bu onye-isi obodo, na ndi-okenye, na ndi nāzù umu eze, we zigara Jihu ozi, si, Ndi-orù-gi ka ayi bu, ayi gēme kwa ihe nile i si ayi me; ayi agaghi-eme nwoke ọ bula eze: gi me ihe di nma n'anya-gi.

6. O we degara ha akwukwọ nke ub͕ò abua, si, Ọ buru na mu ka unu diri, ọ buru kwa na olum ka unu onwe-unu nēge nti, chirinu isi ndikom ahu, bú umu onye-nwe-unu, biakutem dika mb͕e a echi rue Jezreel. Ma umu eze, bú ọgu ndikom atọ na iri, nọ n'aka ndi uku obodo ahu, ndi nāzùlite ha.

7. O rue, mb͕e akwukwọ ahu bara ha n'aka, na ha chiri umu eze, b͕ue ha, bú ọgu ndikom atọ na iri, tiye isi-ha nime nkata, zigara ya rue Jezreel.

8. Onye-ozi we bia, gosi ya, si, Ha ebubatawo isi umu eze. Ọ si, Tukọbanu ha n'obo abua n'oghere ọnu-uzọ-ama rue ututu.

9. O rue, n'ututu, na ọ puru, guzo, si ndi Israel nile, Ndi ezi omume ka unu bu: le, mu onwem kekọtara madu imegide onye-nwem, b͕ue ya: ma ònye tib͕uru ndia nile?

10. Maranu ub͕u a na ọ dighi okwu ọ bula gāda n'ala nime okwu Jehova, nke Jehova kwuru bayere ulo Ehab: n'ihi na Jehova emewo ihe O kwuru n'aka orù-Ya, bú Elaija.

11. Jihu we tib͕ue ndi nile fọduru ulo Ehab nime Jezreel, na ndi uku ya nile, na ndi ọ mara nke-ọma, na ndi-nchu-àjà-ya, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ọ rapuru ya.

12. O bilie, bia, jerue Sameria. Mb͕e ya onwe-ya ruru ulo-nlibe-anu nke ndi-ọzùzù-aturu n'uzọ,

13. Jihu hutara umu-nne Ehazaia, bú eze Juda, ọ si, Òle ndi ka unu bu? Ha si, Umu-nne Ehazaia ka ayi bu: ayi nārida kwa iju ajuju bayere udo umu eze na umu eze-nwayi.

14. Ọ si, Jidenu ha na ndu. Ha we jide ha na ndu, b͕ue ha n'olùlù ulo-nlibe-anu, bú ọgu ndikom abua na abua; o kweghi kwa ka nwoke ọ bula fọdu nime ha.

15. O si n'ebe ahu je, we huta Jehonadab nwa Rikab, ka ọ nābia izute ya: ọ gọzie ya, si ya, Obi-gi, ò ziri ezi, dika obim di n'ebe obi-gi di? Jehonadab we si, Otú a ka ọ di. Ọ buru na ọ di otú a, nyem aka-gi. O we nye ya aka-ya; o we me ka ọ rigo n'ub͕ọ-ala-ya.

16. Ọ si, Jesom, le ekworo m'nēkworo Jehova. Ha we me ka ọ ga ije n'ub͕ọ-ala-ya.

17. Ọ biarue Sameria, tib͕ue ndi nile fọduru Ehab nime Sameria, rue mb͕e o kpochapuru ya, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara Elaija.

18. Jihu we chikọta ndi Israel nile, si ha, Ehab fère Beal òfùfè nke-ntà; Jihu gēfè ya òfùfè rinne.

19. Ma ub͕u a, kpọnu ndi-amuma nile nke Beal, na ndi nile nēfè ya, na ndi-nchu-àjà-ya nile, ka ha biakutem; ka aghara ile anya nwoke ọ bula ma ahughi ya: n'ihi na enwerem àjà uku ichuru Beal; onye ọ bula elere anya ya ma ahughi ya, ọ gaghi-adi ndu. Ma Jihu mere ya n'aghughọ, ka o we me ka ndi nēfè Beal la n'iyì.

20. Jihu we si, Donu ubọchi nb͕ochi nsọ nye Beal. Ha we kpọsa ya.

21. Jihu we ziga ozi n'Israel nile: ndi nile nēfè Beal we bia, ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nke nābiaghi. Ha we ba n'ulo Beal; ulo Beal we juputa na madu site n'otù ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ.

22. Ọ si onye ahu nke bu onye-isi ulo anēdebe uwe, Chiputara ndi nile nēfè Beal uwe. O we chiputara ha uwe.

23. Jihu we ba, ya na Jehonadab nwa Rikab, n'ulo Beal; ọ si ndi nēfè Beal, Chọsienu ike, hu, ka otù nime ndi nēfè Jehova ghara idi n'ebe a n'etiti unu, kama ndi nēfè Beal, nání ha.

24. Ha we ba ime àjà na àjà-nsure-ọku. Ma Jihu doro nye onwe-ya ọgu ndikom anọ n'èzí, si, Nwoke ahu nke kwere ka otù onye wepuga onwe-ya nime ndikom ahu ndi mu onwem nēme ka ha ba n'aka-unu, ndu-ya gālara ndu-ya.

25. O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku, na Jihu siri ndi-ọb͕a-ọsọ, si kwa ndi-isi-agha, Banu, tib͕ue ha; ekwela nwoke ọ bula pua. Ha we were ọnu mma-agha tib͕ue ha; ndi-ọb͕a-ọsọ na ndi-isi-agha tupuru ha n'èzí, jerue obodo ulo Beal.

26. Ha we buputa ogidi nke ulo Beal, sure ha ọku.

27. Ha kwatu-kwa-ra ogidi Beal, kwatu kwa Beal, me ka ọ buru olùlù-ọkwu, rue ta.

28. Jihu we kpochapu Beal n'Israel.

29. Nání nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie, Jihu ewezugaghi onwe-ya n'iso ha, bú umu-ehi ọla-edo ahu nke di na Bet-el, na nke di na Dan.

30. Jehova we si Jihu, N'ihi na i mewo nke-ọma n'ime ihe ziri ezi n'anyam, i we me ulo Ehab dika ihe nile si di nke di n'obim, umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel.

31. Ma Jihu elezighi anya ijeghari n'iwu Jehova, bú Chineke Israel, n'obi-ya nile: o wezugaghi onwe-ya pua na nmehie nile nke Jeroboam, nke o jiri me ka Israel mehie.

32. Na mb͕e ahu ka Jehova malitere ibipu ufọdu n'Israel: Hazael we tib͕ue ha n'ókè ala nile nke Israel;

33. site na Jọdan n'ọwuwa-anyanwu, ala nile nke Gilead, ndi Gad, na ndi Reuben, na ndi Manase, site n'Aroea, nke di n'akuku ndagwurugwu Anon, bú Gilead na Beshan.

34. Ma okwu Jihu nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya nile, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?

35. Jihu we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: ha we lìe ya na Sameria. Jehoahaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

36. Ma ubọchi Jihu bu eze Israel nime Sameria di orú arọ na asatọ.