isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 22 Bible Nso (IGBOB)

1. Josaia b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jedida nwa Adaia nke Bọkzat.

2. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.

3. O rue, n'arọ nke-iri-na-asatọ nke eze Josaia, na eze zigara Shefan nwa Azalaia, nwa Meshulam, bú ode-akwukwọ, n'ulo Jehova, si,

4. Rigokuru Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, ka o we guzù ego ahu nke anēwebata n'ulo Jehova, nke ndi nēche nbata-uzọ chikọtaworo n'aka ndi Israel:

5. ka ha nye kwa ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ihe n'ulo Jehova: ka ha nye kwa ya n'aka ndi nēje ozi nke di n'ulo Jehova, iji me ka ebe etipúru etipú di ike;

6. ka ha nye ya n'aka ndi-ọ̀kà n'osisi, na n'aka ndi nēwu ulo, na n'aka ndi nēdo nkume; na iji zuta osisi na nkume awara awa ime ka ulo ahu di ike.

7. Nání na ha na ndi ahu agughi ego nke anēnye n'aka-ha; n'ihi na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obi ka ndi ahu nēme ihe.

8. Hilkaia, bú onye-isi-nchu-àjà, we si Shefan, bú ode-akwukwọ, Achọtawom akwukwọ iwu ahu n'ulo Jehova. Hilkaia we nye Shefan akwukwọ ahu, ọ gua ya.

9. Shefan, bú ode-akwukwọ, we biakute eze, weghachiri eze okwu, si, Ndi-orù-gi awupuwo ego ahu nke anāchọta n'ulo ahu, ha we nye ya n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ulo Jehova.

10. Shefan, bú ode-akwukwọ, we gosi eze, si, Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, enyewom otù akwukwọ. Shefan we gua ya n'iru eze.

11. O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke akwukwọ iwu ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile.

12. Eze we nye Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam nwa Shefan, na Akboa nwa Maikaia, na Shefan, bú ode-akwukwọ, na Asaia, bú orù eze, iwu, si,

13. Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi nkem, ju-kwa-ra Juda nile, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke amuyeworo dika ọku megide ayi, n'ihi na nna-ayi-hà egeghi okwu nile nke akwukwọ a nti, ime dika ihe si di nke edeworo n'ihi ayi.

14. Hilkaia, bú onye-nchu-àjà, na Ahaikam, na Akboa, na Shefan, na Asaia, we jekuru Hulda, bú onye-amuma-nwayi, nwunye Shalum nwa Tikva, nwa Hahas, onye nēdebe uwe ndi-nchu-àjà; (ma nwayi ahu nēbi na Jerusalem n'obodo nke-abua;) ha we gwa ya okwu.

15. Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Sinu nwoke ahu nke ziri unu biakutem,

16. Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biarue ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú okwu nile nke akwukwọ ahu nke eze Juda guworo:

17. n'ihi na ha arapuwom, we surere chi di iche iche ọzọ ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ka ha we were ọlu nile nke aka-ha kpasuem iwe; ewe muye ọnumam dika ọku megide ebe a, agaghi-emenyu kwa ya.

18. Ma eze Juda, onye nēzite unu iju Jehova ase, otú a ka unu gāsi ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: Okwu ndia nke i nuworo,

19. n'ihi na obi-gi di nrò, i we ruru ala n'iru Jehova, mb͕e i nuru ihe M'kwuru megide ebe a, megide kwa ndi bi nime ya, na ha gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-nkọcha, i we dọwa uwe-gi nile, kwa ákwá n'irum; Mu onwem anuwo kwa, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

20. N'ihi ya, le, M'gāchikọta gi na nna-gi-hà n'ala-mọ agāchikọta kwa gi na ndi ọzọ je n'ílì-gi n'udo, anya-gi agaghi-ele kwa ihe ọjọ a nile nke Mu onwem nēme ka ọ biakwasi ebe a. Ha we weghachiri eze okwu.