isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Neaman, bú onye-isi usu-ndi-agha eze Siria, bu nwoke di uku n'iru onye-nwe-ya, buru kwa onye anāhu iru-ọma, n'ihi na ọ bu n'aka-ya ka Jehova nyere Siria nzọputa: nwoke ahu bu kwa dike nke bu dìnkpà, ma ọ bu onye-ekpenta.

2. Ndi Siria apuwo nēje n'usu ndi nāpunara madu ihe, we si n'ala Israel dọta otù nwa-ob͕ọghọ ntà n'agha; o we nọ n'iru nwunye Neaman.

3. Ọ si nwayi-nwe-ya, Ọ gādim nọ̄ nma, ma asi na onye-nwem nọ n'iru onye-amuma nke nọ na Sameria! mb͕e ahu ọ gēme ka o si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta.

4. Otù onye we ba, gosi onye-nwe-ya, si, Otú a na otú a ka nwa-ab͕ọghọ ahu nke sitere n'ala Israel kwuru.

5. Eze Siria we si, Je, ba, ka m'ziga-kwa-ra eze Israel akwukwọ. O we je, chiri n'aka-ya talent ọla-ọcha iri, na nnù ọla-edo iri-na-ise, na uwe nb͕anwe iri.

6. O were akwukwọ ahu biakute eze Israel, si, Ma ub͕u a, mb͕e akwukwọ a biakutere gi, le, ezìwom Neaman, bú orùm, biakute gi, ka i we me ka o si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta.

7. O rue, mb͕e eze Israel guru akwukwọ ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu Chineke ka m'bu, ime ka madu nwua na ime ka madu di ndu, na nwoke a nēziterem ozi ime ka nwoke si n'ekpenta-ya di ọcha soro ndi-ya zukọta? ma otú ọ di, biko, maranu hu kwa na ya onwe-ya nāchọ uzọ isi megidem.

8. O rue, mb͕e Elaisha bú onye nke Chineke, nuru na eze Israel dọwara uwe-ya nile, o we zigara eze ozi, si, N'ìhi gini ka i dọwara uwe-gi nile? biko, ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n'Israel.

9. Neaman we bia, ya na inyinya-ya nile na ub͕ọ-ala-ya, o guzo n'ọnu-uzọ ulo Elaisha nwere.

10. Elaisha we zigara ya onye-ozi, si, Je, sa aru ub͕ò asa nime Jọdan, anu-aru-gi gālaghachikute kwa gi, i gādi kwa ọcha.

11. Ma Neaman were iwe, laba, si, Le, m'siri, Ọ ghaghi ipukutem, guzo, kpọkue aha Jehova, bú Chineke-ya, fufe aka-ya n'elu ebe ahu, me ka onye-ekpenta di ọcha soro ndi-ya zukọta.

12. Abana na Fapa, bú osimiri Damaskọs, hà adighi nma kari miri Israel nile? #m'gaghi-asa aru nime ha, di ọcha? O we chigharia, laba n'ọnuma.

13. Ndi-orù-ya we biarue nso, gwa ya okwu, si, Nnam, asi na ọ bu ihe uku onye-amuma gwara gi me, ì gaghi-eme ya? ì gēsi kwa aṅa ghara ime ya mb͕e ọ siri gi, Sa aru, di kwa ọcha?

14. O we rida, suye onwe-ya nime Jọdan ub͕ò asa, dika okwu onye nke Chineke si di: anu-aru-ya we laghachi dika anu-aru nwa-okoro ntà, o we di ọcha.

15. O we laghachikute onye nke Chineke, ya onwe-ya na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, bia, guzo n'iru ya, si, Biko, le, amawom na ọ dighi Chineke di n'uwa nile, ọ bu nání n'Israel: ma ub͕u a, biko, nara ihe-ngọzi n'aka orù-gi.

16. Ọ si, Jehova nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, m'gaghi-anara ihe ọ bula ma-ọli. O we rugide ya inara ya; ma ọ juru aju.

17. Neaman we si, Ọ buru na i naghi, biko, ka enye orù-gi ibu ájá nke inyinya mule abua gēbu; n'ihi na orù-gi agaghi-emere chi ọzọ àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ site n'ub͕u a, ma ọ bu náni Jehova.

18. Ka Jehova b͕aghara orù-gi ihe a; mb͕e onye-nwem nābà n'ulo Rimon ikpọ isi ala n'ebe ahu, mb͕e ya onwe-ya nādabere kwa n'akam, m'we kpọ isi ala n'ulo Rimon, mb͕e m'kpọrọ isi ala n'ulo Rimon, biko, ka Jehova b͕aghara orù-gi n'ihe a.

19. Ọ si ya, La n'udo. O we si n'ebe ọ nọ je n'uzọ-ya nwantī.

20. Ma Gihezi, bú nwa-okorọbia Elaisha onye nke Chineke, siri, Le, onye-nwem eb͕ochiwo onwe-ya n'ebe Neaman onye Siria nka nọ, n'ighara inara n'aka-ya ihe o wetara: Jehova nādi ndu, n'ezie m'gāb͕aso ya, nara ihe ufọdu n'aka-ya.

21. Gihezi we chuso Neaman. Neamam we hu otù onye nāb͕aso ya, o we si n'ub͕ọ-ala-ya rida izute ya, si, Ùdo di kwa?

22. Ọ si, Udo di. Onye-nwem ezitewom, si, Le, ọbuná ub͕u a umu-okorọbia abua nime umu ndi-amuma esiwo n'ugwu Efraim biakutem; biko, nye ha otù talent ọla-ọcha, na uwe nb͕anwe abua.

23. Neaman we si, Kwere, nara talent abua. O rugide ya, ke talent ọla-ọcha abua n'akpa abua, chiri uwe nb͕anwe abua, nye umu-okorọbia-ya abua; ha we būru ha ga n'iru ya.

24. Ọ biarue ugwu ntà ahu, nara ha n'aka-ha, tiye ha n ulo: o zilaga ndikom ahu, ha we la.

25. Ma ya onwe-ya bara nime, guzo n'akuku onye-nwe-ya. Elaisha we si ya, Òle ebe i si bia, Gihezi? Ọ si, Orù-gi ejeghi ebe ọ bula.

26. Ọ si ya, Òbim ejesoghi gi, mb͕e nwoke ahu siri n'ub͕ọ-ala-ya chigharia izute gi? ọ̀ bu mb͕e inara ego, na inara uwe, na ubi-olive na ubi-vine, na ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ndi-orù ndikom na ndinyom nēje ozi?

27. Ekpenta Neaman gārapara kwa n'aru gi, na n'aru nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi. Ọ we si n'iru ya pua, buru onye-ekpenta nēnwu dika snow.