isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 3 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma Jehoram nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asatọ nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze arọ iri na abua.

2. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; nání na o meghi dika nna-ya, na dika nne-ya: o wezuga ogidi Beal nke nna-ya mere.

3. Otú ọ di, ọ rapara na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie; o wezugaghi onwe-ya nime ya.

4. Ma Misha, bú eze Moab, bu onye-nwe ìgwè anu-ulo; o we tuara eze Israel utu aji nke orú nnù umu-aturu uzọ iri-na-abua na nnù iri, na nke orú nnù ebulu uzọ iri-na-abua na nnù iri.

5. O rue, mb͕e Ehab nwuru, na eze Moab jehiere megide eze Israel.

6. Eze, bú Jehoram, we si na Sameria pua n'ubọchi ahu, gukọta Israel nile.

7. O je kwa, zigara Jehoshafat, bú eze Juda, ozi, si, Eze Moab ejehiewo megidem: ì gēsorom jekuru Moab ibu agha? Ọ si, M'gārigo: dika m'di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di.

8. Ọ si, Òle nke bu uzọ ayi gēsi rigo? Ọ si, Uzọ ọzara Edom.

9. Eze Israel we je, ya na eze Juda, na eze Edom: ha we ga ije ubọchi asa buruburu: ma ọ dighi miri diri ọmuma-ulo-ikwū ahu, ma ọbu nke diri anu-ulo nke ha chiri je.

10. Eze Israel we si, Ewó! n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab.

11. Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ ebe a, ka ayi we jua Jehova ase site n'aka-ya? Otù nime ndi-orù eze Israel we za, si, Elaisha nwa Shefat nọ ebe a, onye wukwasiri miri n'aka Elaija.

12. Jehoshafat we si, Okwu Jehova di n'ebe ọ nọ. Eze Israel na Jehoshafat na eze Edom we ridakuru ya.

13. Elaisha we si eze Israel, Gini ka mu na gi nwekọrọ? jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi. Eze Israel we si ya, É-è: n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab.

14. Elaisha we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie, ọ buru na ahughm Jehoshafat, bú eze Juda, iru-ọma, m'gaghi-elegide anya n'ebe i nọ ma-ọli, m'gaghi-ahu kwa gi anya ma-ọli.

15. Ma ub͕u a kutaranum ọkpọ-ubọ. O rue, mb͕e ọkpọ-ubọ ahu nākpọ, na aka Jehova di n'aru ya.

16. Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Me ndagwurugwu a ka ọ buru olùlù olùlù.

17. N'ihi na otú a ka Jehova siri, Unu agaghi-ahu ifufe, unu agaghi-ahu kwa oké miri-ozuzo, ma ndagwurugwu ahu gējuputa na miri: unu gāṅu kwa, unu onwe-unu, na anu-ulo-unu, na anumanu-unu nile.

18. Ma nka di nfe n'anya Jehova: Ọ gēnye kwa Moab n'aka-unu.

19. Unu gētib͕u kwa obodo ọ bula ewusiri ike, na obodo ọ bula kachasi nma, unu gēme kwa ka ezi osisi ọ bula da, unu gēkpochi kwa isi-iyi miri nile, were kwa nkume mebie ezi òkè ala-ubi ọ bula.

20. O rue n'ututu, na, mb͕e anēsure onyinye-inata-iru-ọma, le, miri nēsi n'uzọ Edom bia, ala we juputa na miri.

21. Moab nile we nu na ndi-eze ahu arigotawo ibuso ha agha, ha we kpọkọta onwe-ha, site n'onye ọ bula nke nēke onwe-ya ihe-ọkiké agha n'úkwù, we rigorue ndi bu okenye, ha we guzo n'ókè-ala-ha.

22. Ha we bilie n'isi-ututu, ma anyanwu mukwasiri miri ahu, Moab we hu miri ahu na ncherita-iru ha ka ọ nācha ọbara dika ọbara:

23. ha we si, Nka bu ọbara; ekpochapuwo ndi-eze ahu nọ̄, ha etib͕uwo kwa, nwoke ọ bula ibe-ya: ma ub͕u a, Moab, kwatanu ihe-nkwata.

24. Ha biarue ọmuma-ulo-ikwū Israel, Israel we bilie, tib͕ue Moab, ha we si n'iru ha b͕alaga: ha we ba nime ya nētib͕u Moab.

25. Ha we tipia obodo nile ha; ha nātubà kwa, nwoke ọ bula nkume-ya, n'ezi òkè ala-ubi ọ bula, tujue ya; ha nēkpochi kwa isi-iyi miri nile, me ka ezi osisi nile da: rue mb͕e ọ bu nání na Kia-hareset ka emere ka nkume-ya fọdu; ma ndi-ọma-èbè b͕ara ya buruburu, tib͕ue ya.

26. Eze Moab we hu na agha ahu di ike kari ya, o we chiri nnù ndikom na ọgu iri-na-ise tiyere onwe-ya, bú ndi nāmiputa mma-agha, itiwaru eze Edom:

27. O we were ọkpara-ya, nke gābu eze n'ọnọdu ya, sure ya ọku n'elu mb͕idi, ka ọ buru àjà-nsure-ọku. Oké iwe we di megide Israel: ha we si n'ebe ọ nọ bulie ije, laghachi n'ala-ha.