isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 12 Bible Nso (IGBOB)

1. N'arọ nke-asa nke Jihu ka Jehoash malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba.

2. Jehoash we me ihe ziri ezi n'anya Jehova ubọchi-ya nile nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, zíri ya ihe.

3. Nání na ewezugaghi ebe di elu: ndi Juda nọ nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile.

4. Jehoash we si ndi-nchu-àjà, Ego nile nke ihe nsọ nile nke anēwebata n'ulo Jehova, bú ego onye nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, nwoke ọ bula ego madu nile nke ọ̀rùrù-ọnu-ya, na ego nile nke ọ batara n'obi nwoke ọ bula iwebata n'ulo Jehova,

5. ka ndi-nchu-àjà were ya n'onwe-ha, nwoke ọ bula site n'aka onye ọ mara: ha onwe-ha gēme ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike, ebe ọ bula agāchọta ebe etipúru etipú.

6. O rue, n'arọ nke-orú-na-atọ nke eze, bú Jehoash, na ndi-nchu-àjà emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.

7. Eze, bú Jehoash, we kpọ Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa ndi-nchu-àjà ọzọ, si ha, Gini mere unu emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike? ma ub͕u a unu anarala ego n'aka ndi unu mara, kama nyenu ya ime ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.

8. Ndi-nchu-àjà we kwere ka ha ghara inara ego n'aka ndi Juda, ka ha ghara kwa ime ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.

9. Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, we were otù ib͕e, rapúe oghere n'okwu-ya, dọba ya n'akuku ebe-ichu-àjà, n'aka-nri nke ebe madu nābà n'ulo Jehova: ndi-nchu-àjà ndi nēche nbata-uzọ we tiye n'ebe ahu ego nile anēwebata n'ulo Jehova.

10. O rue, mb͕e ha huru na ego ahu riri nne n'ib͕e ahu, na ode-akwukwọ eze na onye-isi-nchu-àjà rigoro, ke ego ahu n'ihe, gu kwa ya, bú nke achọtara n'ulo Jehova.

11. Ha we nye ego ahu nke atùrù atù n'aka ndi nēje ozi ahu, bú ndi nēlekọta ulo Jehova: ha we weputa ya nye ndi-ọ̀kà n'osisi, nye kwa ndi nēwu ulo, bú ndi nālu ọlu n'ulo Jehova,

12. nye kwa ndi nēdo nkume, nye kwa ndi nāwa nkume, na iji zuta osisi na nkume awara awa ime ka ebe etipúru etipú nke ulo Jehova di ike, na ikwu ugwọ ihe nile nāputara ulo ahu ime ka ọ di ike.

13. Otú ọ di, emeghi iko ọla-ọcha, na ihe-ikpakepu-ọku, na ọkwa-nwusa, na opì, ihe ọla-edo ọ bula, ma-ọbu ihe ọla-ọcha, nye ulo Jehova, site n'ego nke anēwebata n'ulo Jehova:

14. n'ihi na ọ bu ndi nēje ozi ahu ka ha nyere ya, were kwa ya me ka ulo Jehova di ike.

15. Ha na ndikom ahu, ndi ha nēnye ego n'aka-ha inye ndi n'eje ozi ahu, agughi ego ahu: n'ihi na ọ bu n'ikwesi-ntukwasi-obí ka ndi ahu nēme ihe.

16. Adighi-ewebata ego àjà-ikpe-ọmuma na ego àjà-nmehie n'ulo Jehova: ọ bu ndi-nchu-àjà nwe ya.

17. Mb͕e ahu Hazael, bú eze Siria, rigoro, buso Gat agha, were ya: Hazael we che iru-ya imegide Jerusalem.

18. Jehoash, bú eze Juda, we chiri ihe nsọ nile nke Jehoshafat, na Jehoram, na Ehazaia, nna-ya-hà, bú ndi-eze Juda, doro nsọ, na ihe nsọ ya nile, na ọla-edo nile anāchọta n'àkù nile nke ulo Jehova, na nke ulo eze, zigara Hazael, bú eze Siria: o we si na Jerusalem rigo.

19. Ma okwu Joash nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

20. Ndi-orù-ya we bilie, kekọta nkekọta-madu imegide ya, tib͕ue Joash n'ulo Milo, n'uzọ nke nāridaru Sila.

21. N'ihi na Jozaka nwa Shimeat, na Jehozabad nwa Shomea, bú ndi-orù-ya, tib͕uru ya, o we nwua; ha we lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: Amazaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.