isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 21 Bible Nso (IGBOB)

1. Manase b͕ara arọ iri na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hefzi-ba.

2. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.

3. Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya mere ka ha la n'iyì, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Beal, me kwa Ashera, dika Ehab, bú eze Israel, mere, ọ kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.

4. O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche n'ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka M'gētiye aham.

5. O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n'ogige abua nke ulo Jehova.

6. O me-kwa-ra ka nwa-ya mwoke gabiga nime ọku, o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, meso kwa onye nāju mọ ihe, na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.

7. Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke Ashera, bú nke o mere, n'ulo ahu nke Jehova siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, N'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:

8. M'gaghi-eme kwa ka ukwu Israel si n'ala nke M'nyere ndi bu nna-ha waghari ọzọ; nání ọ buru na ha elezi anya ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo ha n'iwu, na dika iwu nile si di nke orùm, bú Moses, nyēre ha n'iwu.

9. Ma ha anugh: Manase we me ka ha sihie uzọ ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n'iru umu Israel.

10. Jehova we kwue site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma, si,

11. N'ihi na Manase, bú eze Juda, emewo ihe-árú ndia, we me ihe ọjọ kari ihe nile nke ndi-Amorait mere, ndi buru ya uzọ, o we were arusi-ya nile me ka Juda mehie kwa:

12. n'ihi ya otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biakwasi Jerusalem na Juda, nke nti abua nke onye ọ bula nānu gāzu wuruwuru.

13. M'gēseti kwa n'elu Jerusalem eriri Sameria na ihe-ọtùtù ulo Ehab: M'gēhicha kwa Jerusalem dika madu si ehicha ọkwa, nēhicha ya, nēkpùta ya iru.

14. M'gārapu kwa ndi fọduru nke ihe-nketam, nye ha n'aka ndi-iro-ha; ha gāghọ-kwa-ra ndi-iro-ha nile ihe-nluta-n'agha na ihe ha nānara n'ike;

15. n'ihi na ha emewo ihe jọrọ njọ n'anyam, ha nākpasukwam ìwe, site n'ubọchi ndi bu nna-ha siri n'Ijipt puta, we rue ta.

16. Ọzọ kwa, Manase wusiri ọbara nke-uku ri nne, bú nke nēmeghi ihe ọjọ, rue mb͕e o mejuru Jerusalem site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ; nāgughi nmehie-ya nke o jiri me ka Juda mehie, ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.

17. Ma okwu Manase nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na nmehie-ya nke o mehiere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

18. Manase we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ubi ulo-ya ab͕ara ogige, n'ubi Uza ab͕ara ogige: Emon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

19. Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e o malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Meshulemet nwa Haruz nke Jọtba.

20. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere.

21. O we je ije n'uzọ nile nke nna-ya jere, o we fè arusi òfùfè nke nna-ya fère, ọ kpọ isi ala nye ha:

22. o we rapu Jehova, bú Chineke nna-ya-hà, ọ jeghi kwa ije n'uzọ Jehova.

23. Ndi-orù Emon we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka eze nwua n'ulo-ya.

24. Ndi ala ahu we tib͕ue ndi nile nēkekọta onwe-ha imegide eze, bú Emon; ndi ala ahu we me Josaia nwa-ya eze n'ọnọdu ya.

25. Ma ihe nile nke Emon mere nke fọduru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

26. Ewe lìe ya n'ílì-ya n'ubi Uza ab͕ara ogige: Josaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.