isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 7 Bible Nso (IGBOB)

1. Elaisha we si, Nurunu okwu Jehova: otú a ka Jehova siri, Dika mb͕e a echi agēre otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, n'ọnu-uzọ-ama Sameria.

2. Ọchi-agha ahu onye eze nwere, onye ọ nādabere n'aka-ya, we za onye nke Chineke, si, Le, ọ buru na Jehova eme window n'elu-igwe, ihe a, ọ̀ gādi? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya.

3. Ma ndikom anọ, bú ndi-ekpenta, nọ n'oghere ọnu-uzọ-ama: ha we sirita, onwe-ha, Gini mere ayi onwe-ayi nānọdu n'ebe a rue mb͕e ayi nwuru?

4. Ọ buru na ayi asi, Ayi gābà n'obodo, oké unwu di kwa n'obodo, ayi gānwu kwa n'ebe ahu: ọ buru kwa na ayi anọdu n'ebe a, ayi gānwu kwa. Ma ub͕u a, bianu, ka ayi dabà n'ọmuma-ulo-ikwū Siria: ọ buru na ha edebe ayi ndu, ayi gādi ndu; ọ buru kwa na ha eme ka ayi nwua, ayi gānwu kwa.

5. Ha we bilie n'ururuchi, ibà n'ọmuma-ulo-ikwū Siria: ha we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu.

6. N'ihi na Onwe-nwe-ayi mere ọmuma-ulo-ikwū Siria ka ha nu olu ub͕ọ-ala, na olu inyinya, bú olu oké usu-ndi-agha: ha we sirita onwe-ha, Le, eze Israel egowo ndi-eze ndi Het, na ndi-eze Ijipt, imegide ayi, ibiakwasi ayi.

7. Ha we bilie, b͕alaga n'ururuchi, rapu ulo-ikwū nile ha, na inyinya nile ha, na inyinya-ibu nile ha, ọbuná ọmuma-ulo-ikwū-ha otú di, b͕alaga n'ihi ndu-ha.

8. Ndi-ekpenta ahu we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū, ba n'otù ulo-ikwū, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, si n'ebe ahu chiri ọla-ọcha, na ọla-ebo, na uwe, je zo ha; ha we biaghachi, ba n'ulo-ikwū ọzọ, si n'ebe ahu chiri kwa ihe, je zo ha.

9. Ha we sirita onwe-ha, Ọ bughi ihe ziri ezi ka ayi onwe-ayi nēme: ubọchi ta, ubọchi ozi ọma ka ọ bu, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti: ọ buru na ayi echere rue ìhè ututu, ajọ omume-ayi gāchọputa ayi: ma ub͕u a bianu, ka ayi ba gosi ulo eze.

10. Ha we bia, kpọ onye-ọnu-uzọ-ama obodo òkù, gosi ha, si, Ayi bara n'ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu, ọ dighi kwa olu madu di, ma inyinya elibere elibe, na inyinya-ibu elibere elibe, na ulo-ikwū otú ha di.

11. O we kpọ ndi-ọnu-uzọ-ama; ha we gosi ya ulo eze nime.

12. Eze we bilie n'abali, si ndi-orù-ya, Biko, ka m'gosi unu ihe Siria meworo ayi. Ha mara na agu nāgu ayi onwe-ayi, ha we si n'ọmuma-ulo-ikwū-ha pua izo onwe-ha n'ọhia, si, Mb͕e ha siri n'obodo puta, ayi gējide ha na ndu, ba n'obodo-ha.

13. Otù nime ndi-orù-ya we za, si, Biko, ka achiri inyinya ise nime inyinya fọduru, nke fọduru nime ya, (le, ha di ka ìgwè nile nke Israel nke fọduru nime ya; le, ha di ka ìgwè nile nke Israel ndi gwusiri agwusi:) ka ayi ziga hu kwa.

14. Ha we chiri ub͕ọ-ala abua, ha na inyinya; eze we ziga ha iso ọmuma-ulo-ikwū Siria, si, Jenu, hu.

15. Ha we jeso ha rue Jọdan: ma, le, uzọ nile juputara n'uwe na ihe, nke ndi Siria tufuru n'ime-ngwa-ngwa-ha. Ndi-ozi we lata, gosi eze.

16. Ndi Israel we pua, luta ọmuma-ulo-ikwū Siria n'agha. Ewe re otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, na mb͕é barley abua otù shekel, dika okwu Jehova si di.

17. Eze we me ka onye-isi-agha ahu, bú onye ọ nādabere n'aka-ya, lekọta ọnu-uzọ-ama: ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n'ọnu-uzọ-ama, ọ nwua dika onye nke Chineke kwuru, onye kwuru mb͕e eze ridakuru ya.

18. O rue, dika onye nke chineke gwara eze okwu, si, Agēre mb͕é barley abua otù shekel, na otù mb͕é utu ọka flour otù shekel, dika mb͕è a echi, n'ọnu-uzọ-ama Sameria;

19. onye-isi-agha we za onye nke Chineke, si, Ma, le, ọ buru na Jehova eme window n'elu-igwe, ọ̀ gādi ka okwu a si di? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya:

20. o we diri ya otú a; ndi Israel we zọkwasi ya ukwu n'ọnu-uzọ-ama, ọ nwua.