isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

2. Ndi-Eze 24 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ubọchi-ya Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoro, Jehoiakim we ghọrọ ya orù arọ atọ: o we chigharia nupu isi n'okpuru ya.

2. Jehova we zìe usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Kaldea, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Moab, na usu ndi nāpunara madu ihe nke umu Amon, imegide ya, o zì-kwa-ra ha imegide Juda ime ka ọ la n'iyì, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma.

3. N'ezie n'okwu-ọnu Jehova ka ihe a di n'aru Juda, isi n'iru Ya wezuga ha, n'ihi nmehie nile nke Manase, dika ihe nile si di nke o mere;

4. ọzọ kwa, n'ihi ọbara nēmeghi ihe ọjọ nke ọ wusiri; o we mejue Jerusalem n'ọbara nēmeghi ihe ọjọ: Jehova ekweghi kwa ib͕aghara.

5. Ma okwu Jehoiakim nile fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?

6. Jehoiakim we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: Jehoiakin nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

7. Ma eze Ijipt esighi n'ala-ya puta ọzọ ma-ọli: n'ihi na eze Babilon ewerewo ihe nile eze Ijipt nwere site na miri-iyi Ijipt rue osimiri Yufretis.

8. Jehoiakin b͕ara arọ iri na asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze nime Jerusalem ọnwa atọ: aha nne-ya bu Nehushta nwa Elnetan nke Jerusalem.

9. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.

10. Na mb͕e ahu ka ndi-orù Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoruru Jerusalem, ewe nọchigide obodo ahu n'agha.

11. Nebukadneza, bú eze Babilon, we biarue obodo ahu, mb͕e ndi-orù-ya nānọchigide ya n'agha;

12. Jehoiakin, bú eze Juda, we pukuru eze Babilon, ya onwe-ya, na nne-ya, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-onozi-ya: eze Babilon we jide ya n'arọ nke-asatọ nke ọ bu eze.

13. O si n'ebe ahu chipu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe ọla-edo nile nke Solomon, bú eze Israel, mere n'ulo uku Jehova, dika Jehova siri.

14. O me-kwa-ra ka Jerusalem nile, na ndi-isi nile, na ndi-dike nile bu dìnkpà, je biri n'ala ọzọ, bú orú nnù ise ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ha na onyeọ̀kà ọ bula na uzú ọ bula; ọ dighi onye fọduru, ọ bu nání ndi nēnweghi ike nime ndi ala ahu.

15. O me-kwa-ra ka Jehoiakin je biri na Babilon; nne eze, na ndinyom eze, na ndi-onozi-ya, na ndi-dike nke ala ahu, ndia ka ọ mere ka ha si na Jerusalem je na Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.

16. Ndikom nile kwa ndi bu dìnkpà, nnù iri-na-asa na ọgu iri, na ndi-ọ̀kà na ndi-uzú, nnù abua na ọgu iri, ha nile bu ndi-dike, ndi nēbu agha, eze Babilon we me ka ha bia Babilon ibu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ.

17. Eze Babilon we me Matanaia nwa-nne nna-ya eze n'ọnọdu ya, gughari kwa ya aha Zedekaia.

18. Zedekaia b͕ara orú arọ na otù mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Hamutal nwa Jeremaia nke Libna.

19. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Jehoaiakim mere.

20. N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na nime Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon.