Ma Ehab nwere ọgu umu-ndikom atọ na iri nime Sameria. Jihu we de akwukwọ ziga na Sameria, zigara ndi-isi Jezreel, bú ndi-okenye, ziga-kwa-ra ndi nāzù umu Ehab, si,