isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 28 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we kpọkọta ndi-isi nile nke Israel, bú ndi-isi ebo nile, na ndi-isi òkè nile ndi nējere eze ozi, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-isi àkù na anu-ulo nile eze nwere, na nke umu-ya ndikom nwere, ha na ndi-onozi, na ndi-dike, ọbuná dike ọ bula nke bu dìnkpà, rue Jerusalem.

2. Devid, bú eze, we guzo ọtọ n'ukwu-ya abua, si, Nurunum, umu-nnem, na ndim: mu onwem, ọ di n'obim iwuru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova ulo izu-ike, nke gābu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu Chineke-ayi; m'we dozie ihe iji ewu ulo.

3. Ma Chineke sirim, I gaghi-ewuru aham ulo, n'ihi na nwoke agha ka i bu, i wusiwo kwa ọbara.

4. Ma Jehova, bú Chineke Israel, rọputaram n'etiti ulo nile nke nnam ibu eze Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na Juda ka Ọ rọputara ibu onye-ndú; ma n'ulo Juda Ọ rọputara ulo nnam; ma n'etiti umu-ndikom nnam ihem tọrọ Ya utọ imem ka m'buru eze Israel nile:

5. ma n'etiti umum ndikom nile, (n'ihi na ọtutu umu-ndikom ka Jehova nyerem,) O we rọputa Solomon nwam inọkwasi n'oche-eze nke ala-eze Jehova dika onye-isi Israel.

6. O we sim, Solomon nwa-gi, onye ahu gēwu ulom na ogigem nile: n'ihi na arọputawom ya iburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna.

7. M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, ọ buru na ọ di ike ime ihe nile M'nyere n'iwu na ikpém nile, dika esi eme ta.

8. Ma ub͕u a, n'anya Israel nile, bú nkpọkọta Jehova kpọkọtara, ma na nti Chineke-ayi, debenu, chọ kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu: ka unu we nweta ezi ala nka, me kwa ka umu-unu keta ya rue mb͕e ebighi-ebi, bú ndi gānọchi unu.

9. Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi.

10. Ub͕u a le anya; n'ihi na Jehova arọputawo gi iwu ulo ibu ebe nsọ: di ike, me ya.

11. Devid we nye Solom nwa-ya ihe-atù nke uzọ-nbata ulo uku Chineke, na nke ulo-ya nile, na nke ulo-àkù-ya nile, na nke ime-ulo-elu-ya nile, na nke ime-ime-ulo-ya nile, na nke ulo ebe-nkpuchi-nmehie:

12. na ihe-atù ihe nile nke di n'aka-ya site na Mọ Nsọ bayere ogige nile nke ulo Jehova, baye-kwa-ra ime-ulo nile di buruburu, bayere ulo-àkù nile nke ulo Chineke, baye-kwa-ra ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile:

13. baye-kwa-ra òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, baye-kwa-ra ije-ozi nile nke òfùfè ulo Jehova, baye-kwa-ra ihe nile nke òfùfè ulo Jehova:

14. nke ọla-edo n'ọtùtù bayere ihe ọla-edo, bú ihe nile nke òfùfè ọ bula; nke ọla-ọcha bayere ihe ọla-ọcha nile n'ọtùtù, bú ihe nile nke òfùfè ọ bula:

15. n'ọtùtù kwa bayere ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna nile ha nke ọla-edo, n'ọtùtù bayere ihe-idọba-oriọna ọ bula na oriọna-ya nile: baye-kwa-ra ihe-idọba-oriọna nile nke ọla-ọcha, ọla-ọcha n'ọtùtù bayere ihe-idọba-oriọna ọ bula na oriọna-ya nile, dika òfùfè ihe-idọba-oriọna ọ bula:

16. na ọla-edo n'ọtùtù bayere table nile achicha anēdo n'usoro, bú table ọ bula; ọla-ọcha kwa bayere table ọla-ọcha nile:

17. na ndudu nile, na ọkwa-nwusa nile, na iko nile, nke ọla-edo anāgwaghi agwa: baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-edo nile n'ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula; baye-kwa-ra ọkwa ntà ọla-ọcha nile n'ọtùtù bayere ọkwa ntà ọ bula:

18. baye-kwa-ra ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ ọla-edo anuchara n'ọku n'ọtùtù: baye-kwa-ra ihe-atù ub͕ọ-ala, bú cherubim, ọla-edo, ndi nāb͕asa nkù-ha, kpuchie ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova.

19. Ihe a nile ka Jehova were odide-akwukwọ me ka m'mata site n'aka-Ya n'arum, ka Devid kwuru, bú ije-ozi nile nke ihe-atù a.

20. Devid we si Solomon nwa-ya, Di ike, nwe kwa ume, me ya: atula egwu, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova Chineke, bú Chinekem, nọyere gi; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi, rue mb͕e i jezuru ozi nile nke òfùfè ulo Jehova.

21. Ma le, òkè nile nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai di, ifè òfùfè nile nke ulo Chineke: onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo n'amam-ihe gādi kwa n'aka-gi n'ije-ozi ọ bula, ifè òfùfè ọ bula: ndi-isi na ndi Israel nile gēme kwa ka okwu-gi nile si di.