isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 17 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e Devid biri n'ulo-ya, na Devid siri Netan, bú onye-amuma, Le, mu onwem nēbi n'ulo cedar, ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nēbi n'okpuru ákwà-nkwuba.

2. Netan we si Devid, Ihe nile nke di n'obi-gi, me ya; n'ihi na Chineke nọyere gi.

3. O rue, n'abali ahu, na okwu Chineke ruru Netan nti, si,

4. Je, si Devid, bú orùm, Otú a ka Jehova siri, Gi onwe-gi agaghi-ewurum ulo ibu ebe M'gēbi:

5. n'ihi na ebighm n'ulo site n'ubọchi M'mere ka Israel rigota, rue ta; kama esim n'otù ulo-ikwū ba n'ulo-ikwū ọzọ, si kwa n'otù ebe-obibi ba n'ebe-obibi ọzọ.

6. N'ebe nile nke M'nējeghari n'etiti Israel nile, ọ̀ di okwu M'gwara otù nime ndi-ikpe Israel, nke M'nyere iwu izù ndim, si, N'ìhi gini ka unu nēwurughm ulo cedar?

7. Ma ub͕u a otú a ka i gāsi orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Mu onwem siri n'ebe-ita-nri anu-ulo, si kwa n'ebe i nēso ìgwè ewu na aturu, kuru gi, ka i buru onye-ndú ndim, bú Israel:

8. M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa.

9. M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otù ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eme kwa ha ọzọ ka ha nāka nká ngwa ngwa, dika na mbu,

10. na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel: emewokwam ka ndi-iro-gi nile ruru ala. Anamegosi kwa gi na Jehova gēwuru gi ulo.

11. Ọ gēru kwa, mb͕e ubọchi-gi zuru ijeso nna-gi-hà, na M'gēme ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, onye gēsite n'umu-gi ndikom; M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.

12. Onye ahu gēwurum ulo, M'gēme kwa ka oche-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.

13. Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa: M'gaghi-ewezuga kwa eberem n'ebe ọ nọ, dika M'wezugara ya n'ebe ọ nọ, bú onye buru gi uzọ:

14. ma M'gēme ka o nēguzo n'ulom na n'ala-ezem rue mb͕e ebighi-ebi: agēme kwa ka oche-eze-ya buru ihe guzosiri ike rue mb͕e ebighi-ebi.

15. Dika okwu ndia nile si di, na dika ọhù a nile si di, otú a ka Netan gwara Devid okwu.

16. Devid, bú eze, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Jehova, bú Chineke, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a?

17. Ma nka bu ihe ntà n'anya-gi, Chineke; I we kwue okwu bayere ulo orù-Gi rue mb͕e di anya, I huwokwam dika ọnọdu nke madu nọ n'elu si di, Jehova, bú Chineke.

18. Gini ka Devid gāgwa kwa Gi ọzọ bayere nsọpuru orù-Gi? n'ihi na Gi onwe-gi mara orù-Gi.

19. Jehova, n'ihi orù-Gi, na dika obi-Gi si di, ka I meworo ihe-idi-uku a nile, ime ka amara ihe uku ndia nile.

20. Jehova, ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.

21. Ma òle mba di ka ndi-Gi, bú Israel, nke bu otù mba nke nēguzo iche n'uwa, nke Chineke jere ib͕aputara Onwe-ya ibu otù ndi, imere Onwe-gi aha site n'ihe-idi-uku na ihe di egwu, ichupu mba di iche iche n'iru ndi-Gi, ndi I siri n'Ijipt b͕aputa?

22. I we doro Onwe-gi ndi-Gi, bú Israel, ibu otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke.

23. Ma ub͕u a, Jehova, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, ka eme ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo.

24. Ka eme kwa ka ọ buru ihe kwesiri ntukwasi-obi, ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, bu Chineke Israel nwere: agēme kwa ka ulo Devid, bú orù-Gi, guzosie ike n'iru Gi.

25. N'ihi na Gi onwe-gi, Chinekem, ekpughewo nti orù-Gi, si na I gēwuru ya ulo: n'ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpe ekpere n'iru Gi.

26. Ma ub͕u a, Jehova, Gi onwe-gi bu Chineke onwe-ya, I gwawo kwa orù-Gi ezi ihe a:

27. ma ub͕u a I kwerewo igọzi ulo orù-Gi, ka o we dirue mb͕e ebighi-ebi n'iru Gi: n'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, agọziwo, o we buru ihe agọziri agọzi rue mb͕e ebighi-ebi.