isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 25 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid na ndi-isi usu-ndi-agha we kewaputara òfùfè ufọdu nime umu Esaf, na nke Himan, na nke Jedutun, ndi nēwere ubọ-akwara, na une, na ájà, bu amuma: ọnu-ọgugu-ha, bú ndikom nēje ozi dika òfùfè-ha si di, we di:

2. nke umu ndikom Esaf; Zakua, na Josef, na Netanaia, na Asharela, bú umu Esaf; ha nọ n'aka Esaf, onye nēbu amuma n'aka eze.

3. Nke Jedutun: umu-ndikom Jedutun; Gedalaia, na Zeri, na Jeshaia, na Hashabaia, na Matitaia, isi; ha nọ n'aka nna-ha, bú Jedutun, onye nēwere ubọ-akwara bu amuma bayere ikele na ito Jehova.

4. Nke Himan: umu-ndikom Himan; Bukia, na Matanaia, na Uziel, na Shebuel, na Jerimot, na Hananaia, na Hanani, na Eliata, na Gidalti, na Romamti-eza, na Joshbekasha, na Maloti, na Hotia, na Mahaziot:

5. ndia nile bu umu-ndikom Himan, bú onye-ọhu-uzọ eze n'okwu Chineke, iweli mpi elu. Chineke we nye Himan umu-ndikom iri na anọ na umu-ndinyom atọ.

6. Ndia nile nọ n'aka nna-ha n'ibù abù n'ulo Jehova, chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, iji fè òfùfè nke ulo Chineke; ha nọ n'aka eze, bú Esaf, na Jedutun, na Himan.

7. Ọnu-ọgugu-ha, tiyere umu-nne-ha, ndi ezíworo abù anābùku Jehova, bú ndi nile nwere nghọta, di ọgu iri-na-anọ na asatọ.

8. Ha we fe nzà bayere ihe-ndebe-ha, ha nile n'otù aka ahu, ma onye ntà ma onye uku, onye nwere nghọta tiyere onye anēzí ihe.

9. Ife-nzà mbu nke putara Esaf mara Josef: nke-abua mara Gedalia; ya onwe-ya na umu-nne-ya na umu-ya ndikom di iri na abua:

10. nke-atọ mara Zakua, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

11. nke anọ mara Izri, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

12. nke-ise mara Netanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

13. nke-isi mara Bukia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

14. nke-asa mara Jesharela, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

15. nke-asatọ mara Jeshaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

16. nke-iteghete mara Matanaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

17. nke-iri mara Shimai, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

18. nke-iri-na-otù mara Azarel, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

19. nke-iri-na-abua mara Hashabaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

20. n'ife-nzà nke-iri-na-atọ ọ mara Shubael, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

21. nime nke-iri-na-anọ ọ mara Matitaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

22. nime nke-iri-na-ise ọ mara Jeremot, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

23. nime nke-iri-na-isi ọ mara Hananaia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

24. nime nke-iri-na-asa ọ mara Joshbekasha, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

25. nime nke-iri-na-asatọ ọ mara Hanani, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

26. nime nke-iri-na-iteghete ọ mara Maloti, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-abua:

27. nime nke-orú ọ mara Eliata, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

28. nime nke-orú-na-otù ọ mara Hotia, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

29. nime nke-orú-na-abua ọ mara Gidalti, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

30. nime nke-orú-na-atọ ọ mara Mahaziot, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua:

31. nime nke-orú-na-anọ ọ mara Romamti-eza, umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri na abua.