isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 27 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma umu Israel, dika ọnu-ọgugu-ha si di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-odozi-okwu-ha ndi nējere eze ozi, n'ihe ọ bula nke òkè nile ndi nābata nāpu kwa n'ọnwa n'ọnwa, n'ọnwa nile nke arọ, otù òkè di orú nnù uzọ atọ.

2. Onye-isi òkè mbu nke diri ọnwa mbu bu Jashọbeam nwa Zabdiel: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

3. O sitere n'umu Perez, bú onye-isi nke ndi-isi nile nke usu nile nke ndi-agha nke diri ọnwa mbu.

4. Ma onye-isi òkè nke ọnwa nke-abua bu Dodai onye Ahoa, na òkè-ya; Miklot bu kwa onye-ndú-ha: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

5. Onye-isi usu-ndi-agha nke-atọ nke diri ọnwa nke-atọ bu Benaia nwa Jehoiada onye-nchu-aja, ọ bu onye-isi: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

6. Onye ahu bu Benaia nke bu dike nke orú ndikom na iri ahu, ọ bu kwa onye-isi orú na iri ahu: Amizabad nwa-ya di kwa n'òkè-ya.

7. Onye-isi nke-anọ nke diri ọnwa nke-anọ bu Asahel nwa-nne Joab, Zebadaia nwa-ya so-kwa-ra ya: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

8. Onye-isi nke-ise nke diri ọnwa nke-ise bu Shamhut onye-Izrahait: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

9. Onye-isi nke-isi nke diri ọnwa nke-isi bu Ira nwa Ikesh onye Tekoa: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

10. Onye-isi nke-asa nke diri ọnwa nke-asa bu Hilez onye-Pelonait, onye sitere n'umu Efraim: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

11. Onye-isi nke-asatọ nke diri ọnwa nke-asatọ bu Sibekai onye Husha, nke ndi Zera: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

12. Onye-isi nke-iteghete nke diri ọnwa nke-iteghete bu Abieza onye Anatot, nke ndi Benjamin: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

13. Onye-isi nke-iri nke diri ọnwa nke-iri bu Maharai onye Netofa, nke ndi Zera: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

14. Onye-isi nke-iri-na-otù nke diri ọnwa nke-iri-na-otù bu Benaia onye Piraton, sitere n'umu Efraim: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

15. Onye-isi nke-iri-na-abua nke diri ọnwa nke-iri-na-abua bu Heldai onye Netofa, nke Ọtniel: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.

16. Ndi-isi kwa nke ebo nile nke Israel: nke ndi Reuben, Elieza nwa Zikri bu onye-ndú: nke ndi Simeon, Shefataia nwa Meaka:

17. nke Livai, Hashabaia nwa Kemuel: nke Eron, Zedok:

18. nke Juda, Elaihu, onye sitere n'umu-nne-Devid: nke Isaka, Ọmri nwa Maikael:

19. nke Zebulun, Ishmaia nwa Obadaia: nke Naftali, Jerimot nwa Azriel:

20. nke umu Efraim, Hoshea nwa Azazaia: nke nkera ebo Manase, Joel nwa Pedaia:

21. nke nkera ebo Manase di na Gilead, Ido nwa Zekaraia: nke Benjamin, Jaasiel nwa Abnea:

22. nke Dan, Azarel nwa Jeroham. Ndia bu ndi-isi ebo nile nke Israel.

23. Ma Devid agutaghi ọnu-ọgugu-ha site n'onye b͕ara orú arọ we rida: n'ihi na Jehova siri na Ọ gēme ka Israel ba uba dika kpakpando nke elu-igwe.

24. Joab nwa Zeruaia malitere iguta ha, ma ọ guzughi; iwe we dikwasi Israel n'ihi nka; etiyeghi kwa ọnu-ọgugu n'ọnu-ọgugu nke di n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke eze, bú Devid.

25. Onye-isi ulo-àkù nile nke eze bu Azmavet nwa Adiel: onye-isi ulo-àkù nile nke di n'ọhia, na n'obodo nile, na n'obodo ntà nile, na n'ulo-elu nile, bu kwa Jehonatan nwa Uzaia:

26. onye-isi ndi nēje ozi ubi ilu ọlu ala-ubi bu Ezri nwa Kelub:

27. onye-isi ubi-vine nile bu Shimai onye Rema: onye-isi nke ihe di n'ubi-vine itiye n'ulo nile anēdebe manya-vine bu Zabdi onye Shefam:

28. onye-isi osisi olive nile na osisi sycomore nile nke di n'ebe di ala ala bu Beal-hanam onye Geda: onye-isi ulo nile anēdebe manu bu Joash:

29. onye-isi ìgwè ehi nke nāta nri nime Sheron bu Shitrai onye Sheron: onye-isi ìgwè ehi nke di nime ndagwurugwu nile bu Shefat nwa Adlai:

30. onye-isi camel nile bu Obil onye Ishmael: onye-isi inyinya-ibu nile bu Jehdeia onye Meronot:

31. onye-isi ìgwè ewu na aturu bu Jaziz onye Haga. Ndia nile bu ndi-isi àkù nke Devid nwere.

32. Jonatan nwa-nne nna Devid bu onye nādu ọdu, nwoke nwere nghọta na ode-akwukwọ ka ọ bu: Jehiel nwa Hakmoni nọye-kwa-ra umu-ndikom eze:

33. Ahitofel bu kwa onye nādu eze ọdu: Hushai onye-Akait bu eyì eze:

34. ma nke nēso Ahitofel bu Jehoiada nwa Benaia, na Abaiata: onye-isi usu-ndi-agha eze bu Joab.