isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 19 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e ihe a gasiri, na Nehash, bú eze umu Amon, nwuru, nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2. Devid we si, M'gēmere Hanun nwa Nehash ebere, n'ihi na nna-ya merem ebere. Devid we ziga ndi-ozi ikasi ya obi bayere nna-ya. Ndi-orù Devid we ba n'ala umu Amon jekuru Hanun, ikasi ya obi.

3. Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, Devid, ọ̀ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa ala-ayi, na ikwatu ya, na iledo ya, ka ndi-orù-ya biakutere gi?

4. Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu ha afu-ọnu, bipu kwa uwe-nwuda-ha n'etiti, rue otule-ha, we zilaga ha.

5. Ewe je gosi Devid ihe bayere ndikom ahu. O we ziga izute ha; n'ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata.

6. Umu Amon we hu na ha emewo onwe-ha ka ha nēsi Devid ísì ọjọ, Hanun na umu Amon we ziga nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri igotara onwe-ha ub͕ọ-ala na ndi-inyinya site na Mesọpọtemia, site kwa na Siria Meaka, site kwa na Zoba.

7. Ha we gotara onwe-ha orú nnù ub͕ọ-ala uzọ anọ, na eze Meaka na ndi-ya; ha we bia ma ulo-ikwū-ha n'iru Medeba. Umu Amon si-kwa-ra n'obodo nile ha chikọta onwe-ha, bia ibu agha.

8. Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike.

9. Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'ọnu-uzọ obodo: ma ndi-eze ndi biara nọrọ onwe-ha n'ọhia.

10. Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n'etiti ndi Israel nile arọputara arọputa, do ha n'usoro izute Siria.

11. O tiye ndi Israel fọduru n'aka Abishai, bú nwa-nne-ya, ha we do onwe-ha n'usoro izute umu Amon.

12. Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m'gāzọputa kwa gi.

13. Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya.

14. Joab na ndi soro ya we biarue nso n'iru ndi Siria ibu agha; ha we b͕alaga n'iru ya.

15. Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n'iru Abishai nwa-nne-ya, ba n'obodo. Joab we biarue Jerusalem.

16. Siria we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we ziga ndi-ozi, me ka Siria ndi nọ n'ofè Osimiri puta, Shofak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n'iru ha.

17. Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biakute ha, do agha n'usoro megide ha. Devid we do ndi-ya n'usoro izute Siria, ha we buso ya agha.

18. Siria we b͕alaga n'iru Israel; Devid we b͕ue n'etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ ise, bú ndi ji ukwu eje, o me-kwa-ra ka Shofak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, nwua.

19. Ndi-orù Hedareza we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Devid di n'udo, we fè ya òfùfè: Siria ekweghi kwa izọputa umu Amon ọzọ.