isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 2 Bible Nso (IGBOB)

1. Ndia bu umu-ndikom Israel; Reuben, Simeon, Livai, na Juda, Isaka na Zebulun;

2. Dan, Josef na Benjamin, Naftali, Gad na Asha.

3. Umu-ndikom Juda kwa; Ia, na Onan, na Shila: umu atọ ndia ka Bat-shua, bú nwayi Kenean, muru nye ya. Ma Ia, bú ọkpara Juda, jọrọ njọ n'anya Jehova; O we me ka ọ nwua.

4. Tema, bú nwunye nwa-ya, we muara ya Perez na Zera. Umu-ndikom nile nke Juda di ise.

5. Umu-ndikom Perez; Hezron na Hamul.

6. Umu-ndikom Zera kwa; Zimri, na Itan, na Himan, na Kalkol, na Dara: ha nile di ise.

7. Umu-ndikom Kami kwa; Eka, bú onye nēmekpa Israel aru, onye mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ewezugara nye Jehova.

8. Umu-ndikom Itan kwa; Azaraia.

9. Umu-ndikom Hezron kwa, ndi amuru nye ya; Jerahmeel, na Ram, na Kelubai.

10. Ram we mua Aminadab; Aminadab mua Nahshon, bú onye-isi umu Juda:

11. Nahshon mua Salma, Salma mua Boaz;

12. Boaz mua Obed, Obed mua Jesi;

13. Jesi mua ọkpara-ya, bú Elaiab, na Abinadab, bú nke-abua, na Shimea, bú nke-atọ;

14. na Netanel, bú nke-anọ, na Radai, bú nke-ise;

15. na Ozem, bú nke-isi, na Devid, bú nke-asa:

16. Umu-nne-ha ndinyom bu Zeruaia na Abigail. Umu-ndikom Zeruaia kwa; Abishai, na Joab, na Asahel, atọ.

17. Abigail mu-kwa-ra Amasa: ma nna Amasa bu Jeta onye Ishmael.

18. Keleb nwa Hezron muru umu site n'Azuba, bú nwunye-ya, site kwa na Jeriot: ndia bu umu-ndikom nwayi ahu; Jesha, na Shobab, na Adon.

19. Azuba we nwua, Keleb we lutara onwe-ya Efrat, o we muara ya Hua.

20. Hua mua Uri, Uri mua Bezalel.

21. Emesia Hezron bakuru nwa-nwayi Makia, bú nna Gilead; ma nwoke ahu lutara ya mb͕e ya onwe-ya b͕ara ọgu arọ atọ; o we muara ya Segub.

22. Segub we mua Jaia, nke nwere orú obodo na atọ n'ala Gilead.

23. Geshua na Eram we nara ha Havot-jaia, ha na Kenat, na umu-obodo-ya, bú ọgu obodo atọ. Ndia nile bu umu-ndikom Makia nna Gilead.

24. Ma mb͕e Hezron nwusiri nime Keleb-efrata, mb͕e ahu nwunye Hezron, bú Abia, we muara ya Ashua nna Tekoa.

25. Umu-ndikom Jerahmeel ọkpara Hezron bu kwa: Ram, bú ọkpara, na Buna, na Oren, na Ozem, na Ahaija.

26. Ma Jerahmeel nwere nwunye ọzọ, aha-ya bu Atara; nwayi ahu bu nne Onam.

27. Umu-ndikom Ram, bú ọkpara Jerahmeel, bu Maaz, na Jamin, na Eka.

28. Umu-ndikom Onam bu Shamai, na Jada: umu-ndikom Shamai kwa; Nedab, na Abishua.

29. Aha nwunye Abishua bu Abihail; o we muara ya Ahban, na Molid.

30. Umu-ndikom Nedab kwa; Seled, na Apaim: Seled we nwua nēnweghi umu-ndikom.

31. Umu-ndikom Apaim kwa; Ishi. Umu-ndikom Ishi kwa; Sheshan. Umu-ndikom Sheshan kwa; Ahlai.

32. Umu-ndikom Jada kwa, bú nwa-nne Shamai; Jeta, na Jonatan: Jeta we nwua nēnweghi umu-ndikom.

33. Umu-ndikom Jonatan kwa; Pelet, na Zaza. Ndia bu umu-ndikom Jerahmeel.

34. Ma Sheshan enweghi umu-ndikom, nání umu-ndinyom ka o nwere. Sheshan nwe-kwa-ra orù, bú onye Ijipt, aha-ya bu Jaha.

35. Sheshan we were nwa-ya nwayi nye Jaha, bú orù-ya, na nwunye; o we muara ya Atai.

36. Atai mua Netan, Netan mua Zabad;

37. Zabad mua Eflal, Eflal mua Obed;

38. Obed mua Jihu, Jihu mua Azaraia;

39. Azaraia mua Helez, Helez mua Eleasa;

40. Eleasa mua Sismai, Sismai mua Shalum;

41. Shalum mua Jekamaia, Jekamaia mua Elishama.

42. Umu-ndikom Keleb kwa, bú nwa-nne Jerahmeel; Misha, bú ọkpara-ya, onye ahu bu nna Zif; na umu-ndikom Marisha, bú nna Hebron.

43. Umu-ndikom Hebron kwa; Kora, na Tapua, na Rekem, na Shema.

44. Shema we mua Raham, bú nna Jọkeam; Rekem mu-kwa-ra Shamai.

45. Nwa-nwoke Shamai bu Maon; Maon bu nna Bet-zua.

46. Ifa, bú iko-nwayi Keleb, muru Haran, na Moza, na Gazez: Haran we mua Gazez.

47. Umu-ndikom Jahdai kwa; Regem, na Jotam, na Gishan, na Pelet, na Ifa, na Shaaf.

48. Iko-nwayi Keleb, bú Meaka, muru Sheba na Tiahana.

49. Ọ mu-kwa-ra Shaaf nna Madmana, na Sheva nna Makbina, na nna Gibea; nwa-nwayi Keleb bu Aksa.

50. Ndia bu umu-ndikom Keleb; nwa-nwoke Hua, ọkpara Efrata, Shobal nna Kiriat-jearim;

51. Salma nna Bet-lehem, Harif nna Bet-gadea.

52. Shobal nna Kiriat-jearim nwe-kwa-ra umu-ndikom; Haroe, nkera Menuhot.

53. Ab͕uru nile nke Kiriat-jearim kwa; ndi-Jeta, na ndi-Putait, na ndi-Shumatait, na ndi-Mishraait; nime ndia ka ndi Zọra na ndi Eshtaol si puta.

54. Umu-ndikom Salma; Bet-lehem, na ndi Netofa, Atrot-bet-Joab, na nkera ndi Mahanat, ndi Zọra.

55. Ab͕uru nile kwa nke ndi-ode-akwukwọ ndi bi na Jebez; ndi-Tiratait, ndi-Shimeatait, ndi-Sukatait. Ndia bu ndi-Kinait, ndi nēsite na Hamat, bú nna ulo Rikab.