isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 15 Bible Nso (IGBOB)

1. Devid we mere onwe-ya ulo ufọdu n'obodo Devid; o we doziere ib͕e Chineke ọnọdu, we mara ya ulo-ikwū.

2. Mb͕e ahu Devid siri, Ọ dighi onye gēbu ib͕e Chineke ma-ọbughi ndi Livai: n'ihi na ha ka Jehova rọputaworo ibū ib͕e Chineke, na ijere Ya ozi rue mb͕e ebighi-ebi.

3. Devid we kpọkọta Israel nile ibiaru Jerusalem, ibugota ib͕e Jehova rue ọnọdu-ya, nke o doziri nye ya.

4. Devid we chikọta umu Eron na ndi Livai:

5. nke umu Kohat; Uriel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi:

6. nke umu Merari; Asaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri-na-otù:

7. nke umu Giashom; Joel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom isi na iri:

8. nke umu Elizafan; Shemaia, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom iri:

9. nke umu Hebron; Eliel, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom anọ:

10. nke umu Uziel; Aminadab, bú onye-isi, na umu-nne-ya, ọgu ndikom ise na iri na abua.

11. Devid we kpọ Zedok, kpọ kwa Abaiata, bú ndi-nchu-àjà, kpọ kwa ndi Livai, bú Uriel, na Asaia, na Joel, na Shemaia, na Eliel, na Aminadab,

12. si ha, Unu onwe-unu bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna ndi Livai: donu onwe-unu nsọ, unu onwe-unu na umu-nne-unu, ka unu we bugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel, rue ebe m'doziri nye ya.

13. N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu būru ya na mbu, n'ihi ya ka Jehova, bú Chineke-ayi, tiwaputara megide ayi, n'ihi na ayi achọghi Ya dika ikpé-Ya si di.

14. Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we do onwe-ha nsọ ibugota ib͕e Jehova, bú Chineke Israel.

15. Umu ndi Livai we were nkpa-n'aka-ya abua būru ib͕e Chineke n'ubu-ha n'elu ha, dika Moses nyere iwu, dika okwu Jehova si di.

16. Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n'elu n'ihi ọṅù.

17. Ndi Livai we guzo Himan nwa Joel; na site n'umu-nne-ya, Esaf nwa Berekaia; na site n'umu Merari, bú umu-nne-ha, Itan nwa Kushaia;

18. tiye-kwa-ra ha umu-nne-ha, bú ndi nke usoro nke-abua, Zekaraia, na Ben, na Jaaziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Benaia, na Maaseia, na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, bú ndi-ọnu-uzọ-ama.

19. Na ndi-ọbù-abù, bú Himan, na Esaf, na Itan, chiri ájà ọla ime ka anu udà-ha;

20. na Zekaraia, na Aziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Maaseia, na Benaia, chiri une nke dabàra n'olu umu-ab͕ọghọ;

21. na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, na Azazaia, chiri ubọ-akwara nke dabàra n'octave, ibu ndi-isi nke ndi-abù.

22. Ma Kenania, bú onye-isi ndi Livai, bu isi n'ibū ibu ahu: ọ dọrọ aka na nti n'ibū ibu ahu, n'ihi na onye nwere nghọta ka ọ bu.

23. Berekaia na Elkena bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.

24. Shebania, na Joshafat, na Netanel, na Amasai, na Zekaraia, na Benaia, na Elieza, bú ndi-nchu-àjà, nāfù opì n'iru ib͕e Chineke: Obed-edom na Jehia bu ndi-ọnu-uzọ-ama diri ib͕e ahu.

25. Devid, na ndi-okenye Israel, na ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, we nēje iwere ọṅù si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova:

26. o rue, mb͕e Chineke yere ndi Livai ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova aka, na ha churu oke-ehi asa na ebulu asa n'àjà.

27. Ewere kwa uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha ke Devid ekike, ya na ndi Livai nile ndi nēbu ib͕e ahu, na ndi-ọbù-abù, na Kenania, bú onye-isi n'ibū ibu ahu tiyere ndi-ọbù-abù: ephod ákwà ọcha di kwa n'aru Devid.

28. Israel nile we were iti-nkpu, were kwa olu opì-ike, chiri kwa opì, na ájà, nēbugota ibe ọb͕ub͕a-ndu Jehova, nēwere une na ubọ-akwara me ka anu udà-ha.

29. O rue, mb͕e ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova biaruru obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēgwu kwa egwú; o we leda ya anya n'obi-ya.