isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4
  5. 5
  6. 6
  7. 7
  8. 8
  9. 9
  10. 10
  11. 11
  12. 12
  13. 13
  14. 14
  15. 15
  16. 16
  17. 17
  18. 18
  19. 19
  20. 20
  21. 21
  22. 22
  23. 23
  24. 24
  25. 25
  26. 26
  27. 27
  28. 28
  29. 29

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

1. Ihe Emere 8 Bible Nso (IGBOB)

1. Benjamin we mua Bela, bú ọkpara-ya, na Ashbel, bú nke-abua, na Ahara, bú nke-atọ;

2. na Noha, bú nke-anọ, na Rafa, bú nke-ise.

3. Bela we nwe umu-ndikom; Ada, na Gira, na Abaihud;

4. na Abishua, na Neaman, na Ahoa;

5. na Gira, na Shefufan, na Huram.

6. Ndia bu kwa umu-ndikom Ihud: ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi na Geba, ha we me ka ha je biri na Manahat:

7. na Neaman, na Ahaija, na Gira, onye ahu mere ka ha je biri n'ala ọzọ; ọ mua Uza na Ahaihud.

8. Shaharaim we mua umu n'ọhia Moab, mb͕e o zilagasiri ha; Hushim na Baara bu ndinyom-ya.

9. O we site na Hodesh, bú nwunye-ya, mua Jobab, na Zibia, na Misha, na Malkam;

10. na Jeuz, na Shakia, na Miama. Ndia bu umu-ya ndikom, ha bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna.

11. O site-kwa-ra na Hushim mua Abaitub na Elpaal.

12. Umu-ndikom Elpaal; Iba, na Misham, na Shemed; onye ahu wuru Ono na Lod, na umu-obodo-ya:

13. na Beria, na Shema; ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi bi n'Ajalon, ha onwe-ha mere ka ndi bi na Gat b͕alaga;

14. na Ahio, na Shashak, na Jeremot;

15. na Zebadaia, na Arad, na Eda;

16. na Maikael, na Ishpa, na Joha, bú umu-ndikom Beria;

17. na Zebadaia, na Meshulam, na Hizki, na Heba;

18. na Ishmerai, na Izlia, na Jobab, bú umu-ndikom Elpaal;

19. na Jakim, na Zikri, na Zabdi;

20. na Elienai, na Ziletai, na Eliel;

21. na Adaia, na Beraia, na Shimrat, bú umu-ndikom Shimai;

22. na Ishpan, na Iba, na Eliel;

23. na Abdon, na Zikri, na Henan;

24. na Hananaia, na Ilam, na Antot a;

25. na Ifdeia, na Penuel, bú umu-ndikom Shashak;

26. na Shamsherai, na Sheharia, na Atalaia;

27. na Jaareshia, na Elaija, na Zikri, bú umu-ndikom Jeroham.

28. Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna n'osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi. Ndia biri na Jerusalem.

29. Ma nime Gibeon ka nna Gibeon biri, bú Jeiel, aha nwunye-ya bu Meaka:

30. nwa-ya, bú ọkpara, bú Abdon, na Zua, na Kish, na Beal, na Nedab;

31. na Gedoa, na Ahio, na Zeka.

32. Miklot we mua Shimea. Ha onwe-ha we so kwa umu-nne-ha biri na Jerusalem, na ncherita-iru umu-nne-ha.

33. Nea we mua Kish; Kish mua Sọl; Sọl mua Jonatan, na Malki-shua, na Abinadab, na Eshbeal.

34. Nwa-nwoke Jonatan bu Merib-beal; Merib-beal we mua Maika.

35. Umu-ndikom Maika kwa; Piton, na Melek, na Tarea, na Ehaz.

36. Ehaz we mua Jehoada; Jehoada we mua Alemet, na Azmavet, na Zimri; Zimri we mua Moza:

37. Moza mua Binea; Rafa bu nwa-ya, Eleasa nwa-ya, Azel nwa-ya:

38. Azel nwere umu-ndikom isi, ndia bu kwa aha-ha; Azrikam, na Bokeru, na Ishmael, na Shearia, na Obadaia, na Henan. Ndia nile bu umu-ndikom Azel.

39. Umu-ndikom Ishek nwa-nne-ya nwoke kwa; Ulam, bú ọkpara-ya, na Jeush, bú nke-abua, na Elifelet, bú nke-atọ.

40. Umu Ulam we buru ndi-dike bu dìnkpà, ndi-ọb͕a-uta, ha nwe-kwa-ra ọtutu umu-ndikom, na umu umu, ọgu asa na iri. Ndia nile sitere n'umu Benjamin.